International Press Institute (IPI) network zuru ụwa ọnụ akpọọla oku ka e mee ihe iji chekwaa nnwere onwe nke mgbasa ozi na nchekwa nke ndị nta akụkọ
IPI kpọrọ oku a n’ụbọchị ncheta International Human Rights nke afọ 2022 n’ime ịrị elu nke agha a na-ebuso nnọrọ onwe nke nta akụkọ.
N’ozi ha bipụtara na website ha, ụlọ ọrụ ahụ sonyeere ụlọ ọrụ mgbasa ozi nke akwụkwọ na nke ịnternet na mba South Asia, Bangladesh, India, Nepal na Pakistan na ịmalite ịgbasa ozi iji kụziere ọha na eze mkpa ọ dị ichekwa nnwere onwe mgbasa ozi dịka ide ji ụlọ n’ime ọchịchị onye kwuo uche ya na ikike dịịrị mmadụ.
“Mgbasa ozi a ga-agba n’ozi ụlọ nta akụkọ dị iche iche dị na mba Bangladesh, India, Pakistan na Nepal. Mgbasa ozi a bụ otu n’ime ọrụ IPI ji n’aka na mba dị iche iche nke na-achịkọta ụlọ ọrụ mgbasa ozi na mba ndị a iji mee ka ọha na eze mara banyere agha a na-ebu ndị nta akụkọ na iji mee ka ọ pụta ihe nbibi nke nnwere onwe mgbasa ozi n’ime mpaghara ahụ” ozi ahụ gụpụtara.
India
IPI gosiri na-ejidela ọtụtụ ndị nta akụkọ n’okpuru iwu mgbochi iyi ọha egwu na iwu mpụ ndị ọzọ na India
“A na-enwe nnukwu ndakpọ nke nnwere onwe mgbasa ozi na India kemgbe otu Bharatiya Janata Party batara n’ọchịchị n’afọ 2014 nke Onyeisiala Narendra Modi bụ onye ndu ya”
“A na-egbochikwa ọrụ ndị nta akụkọ site na imechi ịnternet n’India, ebe gọọmentị nọọrọ n’afọ 2021 nye iwu ka emechie network. Enwetaghị ntaramahụhụ maka mwakpo na mpụ megide ndị nta akụkọ dị elu nke ukwuu n’India. Ọ na-ewe ọtụtụ afọ tupu ụlọ ikpe etinye ọnụ na mkpesa.
Pakistan
Ụlọ ọrụ ahụ kwara arịrị na n’agbanyeghị na ndị omebe iwu na Pakistan nọ n’oge adibeghị anya kwado iwu na-echekwa adim mma ndị nta akụkọ maka na mwakpo megide ndị nta akụkọ ka dị elu na mba ahụ.
“Ihe dị ka pasent itoolu na isii nke ikpe ndị nta akụkọ e gburu egbu enwetabeghị ntaramahụhụ. Nke a gụnyere ogbugbu nke Shan Dahar, onye isi ụlọ ọrụ Abb Takk Television na mpaghara Larkana nke dị n’ime Sindh Pakistan, onye a gbagburu n’abalị mbụ nke Jenụwarị afọ 2014. Nnyocha mbụ ndị uwe ojii mere kwuru na ọnwụ ahụ sitere na mgbọ egbe kpafuru akpafu, mana ndị otu ọrụ Dahar na ndị ezinụlọ ya kwenyere na e gburu ya n’ihi ọrụ nta akụkọ ya.”
Bangladesh
Dị ka IPI si kwuo, mwakpo na Bangladesh na-egbochi nnwere onwe mgbasa ozi.
“Na Bangladesh, iwu aka ike nke na-egbochi ọrụ nta akụkọ nnọrọ onwe na-akpagbu nnwere onwe mgbasa ozi na ọchịchị onye kwuo uche ya.”
Ụlọ ọrụ ahụ gbakwụnyere na ndị nta akụkọ nọ na Nepal nwetara nrụgide siri ike n’oge nkwadebe ntuli aka izugbe na Nọvemba
European Union (EU)
Ka ọ dị ugbu a, European Union ekwupụtakwala nchegbu banyere mmebi ikike mmadụ na-emebi na Russia, Afghanistan, Belarus, Etiopia na Myanmar.
,
Na ozi nke European Council bipụtara na Fraịde site na website ya, onye nnọchi anya EU High Representative for Foreign Affairs and Security Policy, Josep Borrell kwuru; “N’afọ a, anyị ahụla ọgụ siri ike na ikike ruru mmadụ, sitere na agha Russia iwu na-akwadoghị megide Ukraine nke kpatara ma na-aga n’ihu na-akpata nhụjuanya ụmụ mmadụ na-enweghị atụ,”
“EU ga-aga n’ihu na-eleba anya, ma na-eme mkpebi siri ike na mba ụwa iji lụso ọgụ na igbochi mmebi iwu na mmegbu mmadụ, na ịkwado atụmatụ mba ụwa iji jide ndị niile na-eme ihe ọjọọ.”
“EU na-akwado ikike mmadụ ma na-akwadokwa ndị na-agbachitere ikike mmadụ na òtù ọha mmadụ gburugburu ụwa.”
Ọ gbakwụnyere, “N’ụbọchị ikike mmadụ, anyị na-agba mbọ ịkwado ma na-ekwuchitere ndị a na-emegbu emegbu na ndị nọ n’egwu, n’ebe ọ bụla ha bi,”
Abalị iri nke ọnwa Disemba bụ ụbọchị ikike mmadụ nke a na-eme ncheta nke nnabata Universal Declaration of Human Rights n’afọ 1948
Ụbọchị a bụ ohere icheta na ikike mmadụ zuru ụwa ọnụ, nke a na-ekewaghị ekewa, adịghị ịgbagha agbagha, dabere na ibe ya ma yie ibe ya.
Ike Umenaba
Leave a Reply