Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuli Aka Afọ 2023: NYSC Adọọla Ndị Otu Ya Aka Na Ntị Megide Nrụrụaka

Ene Audu dere ya na Bekee

0 309

Otu National Youth Service Corps (NYSC) adọọla ndị ji otu afọ efe ala nna ha aka na ntị ka ha ghara itinye aka na wuruwuru n’oge ntuli aka izugbe nke afọ 2023.

Onye nnọchite anya onye isi nke NYSC bụ Oriakụ Christy Uba kwuru nke a mgbe ọ na-agbaghe ụlọ ọgbakọ NYSC nke nwere ohere oche mmadụ narị asato n’ogige NYSC dị n’Agodi, Ibadan, isi obodo steeti Oyo.

Oriakụ Uba kwuru na onye ọ bụla dara iwu nhọpụta ọchịchị ga-enwe ntaramahụhụ etu ọ kwesịrị.

Ọ dụrụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha ọdụ ka ha na-ahụ mba n’anya ma na-asọpụrụ iwu niile oge ha na-ejere ala nna ha ozi.

N’ikwu okwu gaa n’ihu, Uba toro gọọmenti Oyo steeti maka inye ohere agamnihu atụmatụ ụlọ ọrụ ahụ site n’inye ezi nkwado.

O kwuru na NYSC agaghị alaghachi azụ na mbọ ya iji kwalite mmepe mmekọrịta mmadụ na akụ na ụba nke steeti ahụ site na ọrụ ndị otu ahụ .

Onye nnọchite anya onye isi izugbe gwakwara ndị nhazi ọrụ steeti ndị ọzọ ka ha ṅomie ndị nhazi steeti Oyo ma tọgbọ ezi ihe nlele anya maka ọganihu n’oge njedebe ọrụ nke ha.

Onye nchịkọba NYSC na steeti Oyo n’okwu nnabata ya, kwuru na ọ dịla anya ogige ahụ na-achọ nnukwu ụlọ nzukọ kwesịrị ekwesị ma dị mma iji kwado mmemme maka ndị ọrụ na ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

Ọ gara n’ihu kwuo na ogige ahụ nwere ike ịrụpụta ụlọ ahụ site n’onyinye sitere n’aka ụfọdụ ndị enyi nke atụmatụ ahụ na ndị otu na-arụ ọrụ.

N’aha gọọmentị Oyo steeti, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ndị ntorobịa ma burukwa onyeisi, NYSC Oyo State Governing Board, Engr. Seun Akorede kelere ndị ndu NYSC maka nkwado steeti ahụ nwetara site na atụmatụ ha na steeti ahụ.

Ọ rịọrọ ka e nwee mmekọrịta siri ike n’etiti gọọmentị steeti na NYSC maka mmepe obodo.

Ndị ama ama nọ n’oge mgbaghe ụlọ ahụ gụnyere; Onye isi oche kansụl Ibadan North, Maazi Yusuf Olatayo, na onye isi NYSC lara ezumike nka, Oriakụ Foluso Lasaki na ndị ọzọ.

 

 

 

Ike Umenaba

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *