Take a fresh look at your lifestyle.

ỌNWỤ PAUL UNONGO: IHE ỌGHỌM NKE MGBAGO UGWU NA NAIJIRIA.

0 158

Wantaregh Paul Unongo, onye bụbu ọchịọra nke Northern Elders Forum onye nọchikwara anya Amb. Yusuf Maitama Sule, Danmasanin Kano, nwụrụ na Tuzdee, abalị nke 29 ọnwa Nọvemba, 2022 na Jos, n’ihi ọrịa ogologo oge. Ọgbara afọ iri asatọ na asaa.

Ndụ Wantaregh Paul Unongo bụ ihe ọmụmụ gbasara ịhụ obodo n’anya na iweta ezi mgbanwe. O so na ndị ndu nke Zikist Movement, ma jiri ọgụgụ isi, mkpachapu anya na ezi agwa were gafee ọtụtụ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị. O jeere Naijiria ozi n’ogo dị iche iche, bụrụkwa onye Mịnịsta na-ahụ maka igwe na onye isi oche NPP n’oge gara aga.
O so na ndị ntọala nke Northern Elders Forum ndị nkwudosike na inye aka ha n’obodo na mpaghara ugwu ndị ọzọ nọgidere bụrụ ihe ịma atụ . Ọ bụ onye nọchiri anya Danmasanin Kano nwụrụ anwụ ma bụrụ onye na-arụsi ọrụ ike na nzukọ ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ.

Nzukọ ahụ na-eburu ozi iti aka n’obi ha nye ndị ezinụlọ ya, Gọvanọ Benue Steeti, Chief Samuel Ortom, Tor Tiv, ndị Benue Steeti, ndị mgbago ugwu na ala Naijiria dum.

Ka Chineke kwụọ ya ụgwọ ọrụ ọ rụụrụ ndị Naijiria na ụwa dum.

Leave A Reply

Your email address will not be published.