Take a fresh look at your lifestyle.

INEC Achọpụtabeghị Ọnụọgụ PVC Gbara Ọkụ N’ụlọ Ọrụ Ya N’Ebonyi

Moses Nwite dere ya na Bekee

0 147

Ụlọ ọrụ ntụliaka ọchịchị, bụ Independent Electoral Commission (INEC), na-ekwu na ọ ka ga-amata ọnụ ọgụgụ kaadị ntụliaka (PVC) nke ebibiri n’ụlọ ọrụ ya dị n’Iboko, isi obodo kansul Izzi nke steeti Ebonyi.

Ozi nke onye kọmishọna na-ahụ maka INEC na mba ahụ binyere aka na ya, bụ onye isi kọmitii na-ahụ maka mgbasa ozi na mmụta gbasara ịtụ vootu, bụ Maazị Festus Okoye kọwara na ọkụ mebiri ihe niile dị n’ime ụlọ ọrụ ahụ.
Ha gụnyere igbe ịtụ vootu dị narị atọ na iri anọ, ụlọ mpịachi eji atụ vootu nke dị otu narị na iri atọ na igwe ọkụ eletrik iri na anọ yana ụfọdụ tankị mmiri.

Dịka ozi a si kwuo, kọmishọna INEC n’Ebonyi steeti bụ Oriakụ Ugochi Onyeka kwuru na ndị amaghị ama gbara ụlọ ahụ ọkụ n’elekere iri nke ụtụtụ na-ekwusi ike na ihe a bụ mwakpo nke atọ a wakporo ụlọ ọrụ INEC n’ọnwa a ka ihe yiri nke a mere na steeti Ogun na Osun.

Ihe Ndị Mmadụ Mere

Otu n’ime ndị bi n’mpaghara ahụ, Mazị Nkwuda Chijioke kpọkuru gọọmenti Nigeria na INEC ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n’ihi na ọkụ dị otu ahụ nwere ike igbochi ọganiihu nke ntuliaka na-abịa.

Otu onye hụrụ ihe mere nke rịọrọ Voice of Nigeria ka a hapụ ịkpọ aha ya kwuru na ihe a mere n’oge ụtụtụ gbakwunyekwa na ọkụ gbara ụlọ ọrụ ahụ kpamkpam.

Nwaafọ ọzọ bụ Maazị Ubo Echena kwuru na ọkụ ọgbụgba ahụ bụ aka ọrụ ndị ajọ mmadụ n’obodo.
Ọ kpọrọ oku maka enyemaka mberede n’ebe niile a gbara ụlọ ọrụ INEC ọkụ.

Mgbalị iji chọpụta ma ọkụ ahụ emetụtara kaadị ntuliaka a ga-ekesa n’mpaghara ahụ yana akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpa bụ nke amịtaghị mkpụrụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze na steeti ahụ, bụ Maazị Chris Anyanwu kwupụtara na ọkụ ahụ gbara n’ezie mana ya enweghị nkọwa miri emi dịka n’oge e depụtara akụkọ a.

Mgbalị niile e mere iji nweta onye isi oche kansụl ime obodo ahụ, Mazị Steven Nwankpa amịtaghị mkpụrụ.

 

Ike Umenaba.

Leave A Reply

Your email address will not be published.