Take a fresh look at your lifestyle.

Ekwenyerem Itufu Ndụ M Karịa Ịda Ada – Peter Obi

Ugonma Cokey

0 452

Onye ji aha Labour Party (LP) azọ ọkwa onyeisiala bụ Maazị Peter Obi ekwuola na ya ga-aga n’ihu ịchụ ndụ ya n’aja karịa ịda ada n’ọrụ dịka onyeisiala Naijiria.

Mazị Obi bụ onye ọbịa n’ọgbakọ Editors Forum na Lagos kwuru na ọ dịla njikere ịchị ọchịchị ndozi ihe.

Dị ka o si kwuo, “Ọ bụrụ na ndị Naijiria goro m n’ọrụ, agam akọrọ ha akụkọ ọma, agaghị m echetara ha akụkọ ihe gara aga. ị naghị ewe onye ọhụrụ n’ọrụ ka o chetara gị ihe gara aga. Agaghị m enye ihe ngọpụ ma ọ bụ mkpesa.”

Ịgbaso Ọrụ Nchekwa

Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party ahụ kwuru na ọchịchị bu ihe nile na ya ga-anọ n’isi mee ngwangwa inye ọrụ nchekwa ọnọdụ kwesịrị.

O kwukwara na ya ga-eji teknụzụ mee ihe gbasara ọrụ nchekwa, ọkụ latrik iji mee ka Naijiria si na mba oriri gafee bụrụ mba na-arụpụta ihe. “Agam ebuso enweghị ọkụ latrik agha, ọrụ onye ndu abụghị ngọpụ ma ọ bụ mkpesa.”

Onye ndọrọ-ndọrọ ọchịchị LP ahụ  kwere nkwa ibelata tigbuo-zọgbuo, ịla ihe gọọmenti n’iyi na oke ọnụ ahịa ihazi ọchịchị, weta ezigbo usoro iji mee ka ihe gaa nke ọma.

Ọ dụrụ ndị Naijiria ọdụ ka ha nyochaa ihe omume gara aga nke ndị na-azọ ọkwa onyeisiala iji chọpụta ma ha ekwesịrị ekwesị maka ọrụ ahụ “Ọrụ onyeisiala chọrọ ezi agwa, ime ihe nke ọma, ịdị uchu na ịdị ike iji mee ihe ziri ezi. Ọ chọrọ ikike uche na nke anụ ahụ.”

Ntuli aka nke afọ 2023 dị ka o si kwuo, ekwesịghị ịdabere n’agbụrụ, ekpemekpe ma ọ bụ asambodo kama o kwesịrị ịdabe n’agwà onye na-azọ ọkwa.

Ọ gbakwụnyere na ya bụụrụ gọvanọ site n’amara na ya agaghịkwa emetọ amara ahụ.

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *