Take a fresh look at your lifestyle.

Akaọrụ iri a na-agbara ọsọ ndị ọzọ ji eriju afọ

0 752

Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-arụ ọrụ ndị mmadụ na-akpọ n’imi, ọrụ ndị e nwereike ịsị “tụfịakwa, ọ bụghị m ga-arụ nke a”.

Mgbe a na-eto, a jụọ “kedụ ihe ị chọrọ ịbụ mgbe i toro?” ọtụtụ ndị na-ekwu na ha chọrọ ịbụ dọkịta, injinia, ọkaiwu, onye nkuzi, ọgbabọọlụ, onye uweojii maọbụ onye agha wdgz.

Mana ọrụ ndị anyị na-ekwu maka ha n’akụkọ a bụ ọrụ ndị ọtụtụ ndị na-arụ ha arọghị nrọ ịmetụ aka n’ụwa ha, mana ọnọdụ tinyere ha n’ime ya.

Ọrụ ndị ahụ bụ ọrụ ndị dị ezigbo mkpa n’ụwa, nke ọtụtụ ndị na-elelị anya.

Lee ọrụ ndị ahụ ị na-arọghị nrọ ịrụ mana ndị ọzọ na-arụ:

1) Ịsa na ịwa ozu (embalmer):

Ọrụ onye bekee kpọrọ ’embalmer’ gụnyere ịsa na ịwa ozu ma kwado ya maka olili.

Ọrụ a bụ ọrụ ndị ọ kara obi n’ihi na ọ gụnyere ịgbapụ ọbara n’ahụ ozu, ịgbanye ya mmiri ndị e ji echedo ozu nakwa itechi ozu ka ọ dị mma ile anya.

Ndị na-arụ ya bụ ndị na-edili ọnwụ na ihe ndị na-eso ya. Ọ ga-edili arịrị ndị nwe ozu.

Ọ bụ ndị ahụ na-ahụ na ozu atọgbọghị ma na-esigbu ndị dị ndụ, ọrụ ha na-arụ na-emekwa ka ozu nọtetu obere aka tupu o rekasịa.

Gị na-agụ akụkọ a, a sị gị bụrụ ọsa ozu ị ga-ekwe? Mana e nwere ndị na-arụ ya ma rụta ya ọfụma.

2) Oburu nsị (sewage cleaner/disposer):

Ọrụ a abụghị ọrụ ‘nwa mummy’, ọ bụ ọrụ onye obi kara n’ihi na enweghi ihe na-asọ oyi ka ịhụ nsị onye ọzọ anya, ọkachasị ebe o juru eju bara abara.

Ọrụ ha gụnyere ikpocha nsị dị na ya bụ soakaway nakwa ịsachapụ ya mmiri.

Mkpa ọ dị bụ na ọ bụghị na ha ekpochaghị ‘soakaway’ gị, nsị ga-etofe ya ma pụtawazie ebe ọ ga-anọchi ụzọ.

Nke a nwereike ibute nsogbu gụnyere ọrịa na ihe ndị ọzọ.

3) Ịgba ozu ọkụ (cremators):

Ọrụ ndị a dị ka ọrụ onye na-asa ozu, mana kama ọ na-asa ozu, ọ na-agba ozu ọkụ.

Ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịgba ozu ọkụ kama itinye n’akpati kwaa ya akwaa ma lie ya eli.

N’ihi ndị ahụ na-achọghị ili ozu ka e ji nwee ndị na-agba ozu ọkụ. A gbachaa ozu ọkụ e fesaa ntụ ahụ n’ikuku maọbụ na mmiri, dịka ndị nwe ozu ahụ si chọọ.

Ọrụ ha dị mkpa n’ihi na ọ na-eme ka e belata etu e si egwu ala, nke nwereike ịkpata ka e gbutuo osisi na-enyere ihuigwe aka.

Mana ọ na-ere isi abụọ n’ihe gbasara ihu igwe n’ihi na ịkpọ ihe ọkụ na-emebikwa ihu igwe.

4) Ndị na-akpa alumi (recyclers):

Ndị na-akpa alumi (aha ha si na aluminium) bụ ndị na-agagharị na-atụtụ igwe, plastik na ihe ndị ọzọ na-emeju atịtị.

Ọtụtụ ndị na-elelị ha anya, na-ahụ ha ka ndị enweghi akaọrụ, mana ọrụ ha dị oke mkpa n’ihi na a na-ejikarị ihe ndị ha tụtụtara wee na-arụgharị maọbụ rụpụta ihe ọhụrụ ọzọ.

Mkpa ọzọ ọ dị bụ na ọrụ ha na-enyere ihuigwe aka n’ihe Bekee kpọrọ ‘climate change’. Nke a bụ n’ihi isi ọrụ ha bụ nke Bekee kpọrọ ‘recycling’.

Ọzọ bụkwa na a hapụ ihe ndị ahụ mebiri emebi ị na-atụpụta n’ụlọ gị ka ha nọrọ ebe a tụsara ha, ọ pụtara na ọ ga na-eme ka ikpo atịtị buo nnukwu ibu ma na-anọchi ụzọ.

5) Ikpo atịtị:

Enweghi onye ọ bụ nrọ ya ịbụ okpo atịtị, mana ndị mmadụ na-arụ ya.

Ọ bụ ha na-ahụ na ihe ndị ị tụpụtara n’ụlọ gị anọchighi gị ụzọ ma butere gị nsogbu gụnyere ọrịa.

Ọ bụghị ọrụ gị na-atụpụta atịtị ga-achọ ịrụ n’ihi na ọ gụnyere ịtụtụrụ na ịmetụ atịtị na-abụghị nke gị, nke ga-enwecha ihe ndị na-asọ oyi, aka.

N’ihi ndị na-ekpofu ahịhịa, atịtị anaghị atagbu gị n’ụlọ gị.

6) Ilekọta ndị agadị:

Ọ bụ ekpere onye ọbụla ibi ogologo ndụ, kaa nka tupu a nwụọ, mana ọ bụghị ekpere onye ọbụla ịrụ ọrụ dị n’ilekọta onye merela agadị.

Ọ bụghị onye ọbụla ga-arụnwu ọrụ a n’ihi na ọ na-aratu ahụ ịrụ. Nke a bụ n’ihi na e nwere ndị ọ na-ara ahụ ilekọta onye na-abụghị ọbara ha (onye ezinaụlọ ha).

Ọrụ a bụ ọrụ ndidi; ọ dịghịkwanụ mfe inwe ndidi ebe ndị merela agadị nọ n’ihi na ụwa na-arazị ụfọdụ n’ime ha ahụ n’agadị (ndị na-akpabu ike oge ha nọ .

Ọrụ a dị mkpa n’ihi na ụfọdụ ezinaụlọ enweghi ndị na-anọnyere ndị agadị ha nwere n’ụlọ ka ha nwee ohere gara mkpa ha; ndị na-arụ ọrụ a na-egbo mkpa a.

Ọ bụ ndị a na-elekọta ndị agadị ahụ, hụ na ha sara ahụ ma na-ekpocha na-azacha ebe ha nọ wdgz.

7) Ndị na-eke nri (waiter/waitress):

Ọrụ onye na-eke nri bụ ọrụ ndidi n’ihi na ọ bụghị mmadụ niile na-akwanyere ha ugwu. Ọ bụghịkwanụ ọrụ mmadụ na-arọ nrọ ịrụ oge ọ dị na nwata.

E nweela ọtụtụ mgbe ndị iwe ọkụ wụrụ ha nri, mmanya maọbụ mmiri n’ahụ n’ihi mmehie so ihe ha ‘tụrụ order’ ya na ihe e wetere ha.

Iwu ji ụlọọrụ ha anaghị ekwekarị ha bọgwọrọ ọbọ ma ụdịrị ihe a mee ha n’ọrụ, nke bụ na ị ga-elo iwe ya bụ ihe ga-akpalite.

Ọzọ bụ na e nwere ndị nke na-arụ ọrụ ebe a na-ebikarị ma na-etichara ha aka; ihe dị ka ndị na-arụ n’ebe a na-aṅụ mmanya nke Bekee kpọrọ ‘beer parlour’.

Mana ị ma etu ha si dịrị ezigbo mkpa? Ọ bụ gị ga-ejiri aka gị enye onwe gị nri n’ụlọ oriri na nkwari? Ọ bụ ọrụ ha ịhụ na nri na mmanya ị chọrọ rutere gị aka.

Ụfọdụ oge ọ bụkwa ọrụ ha ịhụ na ebe ị nọ eri nri dịkwa ọcha, ka ị ghara ibute ọrịa ebe ị gara iri nri.

8) ‘Vulcanizer’:

Ọrụ onye ‘vulcanizer’ bụ ịgbanye ikuku na taya ụgbọala maọbụ ọgbatumtum ma ọ daa afọ.

Ọrụ a abụghị ọrụ a dị ọcha arụ n’ihi na unyi na atịtị ga-emechurịrị gị.

Ya mere, ụfọdụ oge ị ga-ahụ na ndị na-arụ ya nwere otu akwa ruru unyi ha na-eyi arụ ọrụ ha tupu ha agbanwee ya yiri nke dị ọcha laa.

N’agbanyeghi na a na-amụ ya bụ ọrụ amụ dịka ịgba bọyị, enweghi onye na-arọ nrọ iji ya mere akaọrụ mgbe ọ bụ nwata.

Ọrụ a dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ bụrụ na e nweghi ndị na-afụnye ikuku na taya, kedụ etu ndị na-eme njem ga-esi na-eme ya? Mmadụ aga abụnwu eji ụkwụ eje Aba?

9) Ndị na-ere mmanụ ụgbọala:

Ndị na-arụ ọrụ a na-enwe ezigbo ndidi n’ihi na ha na-ezute ụdịrị mmadụ dị iche iche; ma ndị iwe na-ewe ma ndị enweghi ndidi.

Ọrụ ha na-emepekwa ohere ikuru anwụrụ na-eso mmanụ ụgbọala (fumes) ụfọdụ oge, nke na-adịghị mma n’ahụ mmadụ.

Ọtụtụ ndị ọ bụ ọrụ ha ugbua arọghị nrọ ịhụ onwe ha n’ọnọdụ a, mana ha ji obi ha na-arụ ya.

Ọrụ ha dị mkpa ọkachasị na mpaghara ụwa ebe ndị ọ bụ mmanụ ka ụgbọala na-eji aga.

Mana mara na e nwere ụfọdụ mba dị n’ụwa ebe ọ bụ gị na-akwọ ụgbọala ga-eji aka gị agbanye mmanụ n’ụgbọala gị.

10) Igwu ili:

E nwere onye ọ bụ nrọ ya ịrụ ọrụ a? Mana ndị mmadụ na-arụ ya tinye ‘jara’.

Ọ bụ ọrụ e ji ike na ndidi arụ n’ihi na ọ dịghị ofele igwubanye ala n’ime ebe ọ ga-eru fiti isii.

Ọ bụrụ na ndị na-arụ ya arụghị ya, ọ pụtara na ozu na akpati ozu ga na-adọ n’elu ala.

Mana marakwa na e nwere mpaghara ndị e ji igwe traktọ egwu ala ili.

Ọzọ…

Ọrụ ndị ọzọ dị ka ha gụnyere ọrụ gbagbuo (ndị na-agwọkọta kọnkịrị na sịmentị na ihe ndị ọzọ ebe a na-arụ ụlọ), ndị ‘job’ (ndị na-ebu ngwongwo n’ime ahịa) wdgz.

Ọrụ ndị a dị mkpa n’ụzọ nke ha, n’ihi na ha na-enye aka ịhụ na obodo dị ọcha ma dị mma obibi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *