Take a fresh look at your lifestyle.

Russia ejila iwe jụ oku ka ha kwụọ ụgwọ ihe agha mebiri na Ukraine

0 481

Mba Rọshịa ajụla ikwụ ụgwọ ihe agha ha na-ebu mba Yukren mebiri dịka e kpebiri na ọgbakọ United Nation nke ndị isi ala mba dị iche iche nwere.

Onụ na-ekwuru mba RọshịaDmitry Peskov kwuru na mba dị dị n’Ọdịọ̄a Anyanwụ Yurọp na-achọ izu ha ohi anyaọcha, na ha agaghị enye ohere ka ha weghara akụ Rọshịa nwere na mba ndị ọzọ.

Mkpebi United Nation nke mba 94 n’ime 193 binyere aka bụ “ Rọshịa ga-ata ahụhụ nile metụtara iwu maka ndajọ nile nakwa ihe mmebi n’ile ha metara.

Mkpebi ahụ gụnyere alo ka ndị mba ndị dị n’otu UN nyere Yukren aka idekọ ihe akaebe megide Rọshịa.

Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky nabatara mkpebi.

Onye nnnọchite anya RỌshịa n’ọgbakọ UN bụ Vassily Nebenzia kwuru na mkpebi ahụ bụ nkịtị nkịtị ma bo mba ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ Yurop ebubo ime ka nsogbu dị n’etiti Rọshịa na Yukren kawanye njọ.

Mba 14 gụnyere Rọshịa, Iran na China akwadoghị mkpebi ahụ e nwere n’ọgbakọ Ukwu United Nations, ebe ndị ọzọ atụnghị vootu ma ọlị. Na-agbanyeghị na n’Oktoba mba 143 katọrọ Rọshịa maka mwakpo Yukren.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *