Take a fresh look at your lifestyle.

Kọmishịona Na-Ahụ Maka Ntụliaka Kwara Arịrị Maka Omume Igbahapụ PVC

Tunde Akanbi

0 380

Onye Kọmishọna na-ahụ maka ntụliaka ọchịchị, Resident Electoral Commissioner (REC) na steeti Kwara, Maazị Attahiru Madami, akwaala arịrị banyere omume ọjọọ nke ndị mmadụ maka ịbịa nara kaadị ntụliaka, Permanent Voters Cards, (PVC) na steeti ahụ

Mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ ha mere n’Ilorin, isi obodo steeti ahụ na Wenezde maka nkwadebe ntuliaka izugbe nke afọ 2023 na steeti ahụ, onye isi INEC kwuru na kọmishọn ahụ ka na-enwe ọtụtụ ihe iche aka mgba na steeti ahụ n’ihe gbasara ikesa PVC.

Dị ka o si kwuo, n’ime PVC ọhụrụ puku iri anọ na isii, narị isii na abụọ, enwetara n’isi ụlọ ọrụ INEC dị na steeti ahụ, ọ bụ naanị puku iri na asatọ, narị asatọ na iri asatọ na ise ka e kesagoro ebe puku iri abụọ na asaa, narị isii na abụọ fọdụrụ.

“Site na afọ 2011 ruo 2019 steeti ahụ nwere ọnụọgụ PVC 233, 856 nke anarabeghị, gbakwụnye na ọ bụ naanị 20,752 ka a naaragolu n’ime ọnwa Ọktoba nke afọ a ebe ihe karịrị 193,000, fọdụrụ, Madami kwuru.

O kwukwara na steeti ahụ nwere ndebanye aha 43,008 na-ezighi ezi, otu n’ime ndị kacha nta n’obodo Naijiria.

Madami kwuru na steeti ahụ nwere ndebanye aha 1,689,288 ka ọ dị ugbu a, ebe e nwere ndebanye aha dị 1,401,895 n’afọ 2019.

Ọ gbakwụnyere, “ọnụọgụ ndebanye aha emeruru n’isi bụ 330,401 ma ọnụ ọgụgụ ndebanye aha ziri ezi bụ 287, 393.”

N’uche nke ya, Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ, Paul Odama, dọrọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị ka ha ghara inye ndị na-akwado ha anwụrụ ike.

Kọmishọna ndị uwe ojii ahụ gbara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ume ka ha malite mgbasa ozi sitere n’ihe a chọrọ achọ na abụghị ihe ma ọbụ ozi dabeere na mmadụ.

Odama kwusiri ike mkpa ọ dị ndị na-achọ ọrụ ọchịchị ịhụ na ndị na-eso ụzọ ha bụ ndị omume ha ziri ezi oge niile.

“Dịka e debere n’iwu ntuli aka, ịzụrụ votu na ire votu” bụ nke iwu akwadoghị”. Ọ dọrọ aka na ntị.

“N’akụkụ nke anyị, anyị ga-eme ike anyị niile iji kwado ma hụ na ọchịchị onye kwuo uche ya gbanyere mgbọrọgwụ n’obodo a.

Onye isi ndị uwe ojii dọkwara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị ka ha gbanarị omume ndị omekome ma hapụ imebi bọọdụ mgbasa ozi nke paati ndị ọzọ.

 

Ike Umenaba

Leave A Reply

Your email address will not be published.