Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkụ agbaala n’ahịa Ọgbọọgwụ dị n’Onitsha

0 413

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọkụ na-agba n’ahịa Ogbo ogwu dị na ‘Headbridge’ Onitsha.

Ndị hụrụ ebe ihe mere na-ekwu na ọ bụ kemịkalụ gbapụrụ dịka ogbunigwe mana amabeghi nke bụ eziokwu.

E kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ndị ọrụ mmenyụọkụ kwụ chịm n’ebe ahụ.

N’ime ihe onyonyo ndị na-efegharị na soshal midia, ị nwereike ịhụ ebe ọkụ na-agba n’ebe akpọrọ ‘Gọvernment Line’ n’ahịa ahụ.

Ndị ime ahịa ahụ na-ekwukwa na ọkụ ahụ malitere ịgba kemgbe etiti ụbọchị bụ elekere iri na abụọ.

Kedụ ihe kpatara ọkụ ahụ?

Mgbe ndi ntaakụkọ garuru n’ahịa ahụ, ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n’ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ebe edobere Kemikal ka ọkụ ahụ si bịa.

O kwuru na ha gwara ya ebe adọsara kemịkal n’ahịa ahụ gbapụrụ dịka ogbunigwe were malite ịgba ọkụ.

Otu onye hụrụ ebe ihe mere gwara ndi ntaakuko na ọkụ ahụ si n’ime ụlọ mapụ otu nwaanyị. Ha kwukwara na ọ kụrụ nwaanyị ọzọ n’ala ma dọwaa ntị ya.

Mana onyeisi ndị ọrụ mmenyụọkụ apụtabeghi kwuo ihe ọ bụ butere ya bụ ọkụ.

Kepu kepu na-ekwukwa na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya bụ ọdachi mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ.

Ka ihe si kwụrụ ugbua, emenyụọla ọkụ ahụ na-agba ebe ndị ọdọ ahịa ha dị nso n’ebe ahụ ka na-azọpụta ngwa ahịa ha ndị fọrọnụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *