Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala kwuru na Naijiria na-agbasi mbọ ike ime ka usoro ochichi onye kwuo uche ya guzosie ike.

TIMOTHY CHIOJI dere ya na bekee.

0 376

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwughachila nkwa na Naijiria na-agbasi mbọ ike ime ka usoro ochichi onye kwuo uche ya guzosie ike.

Onye isi ala Buhari kwuru nke a na Tọzdee na Seoul, South Korea, n’oge nzukọ ya na Onye isi oche nke National Assembly of Korea, Mr. Kim Jin-Pyo, na akụkụ nke World Bio Summit 2022. Onye isi ala kwupụtara na ihe ịga nke ọma e nwetara na ntuliaka n’oge na-adịbeghị anya na steeti Anambra, Ekiti na Osun, kwadoro na ndị Naijiria akwadola ụdị ọchịchị onye kwuo uche ya.

 

Dị ka ya si kwuo, “Anyị ji mpako na e nyere ndị obodo anyị ikike ịhọrọ onye ga-achị na ịnọchite anya ha n’ụlọomeiwu dị iche iche na steeti na gọọmenti etiti.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *