Take a fresh look at your lifestyle.

Ọrịa na-anaghị efe efe bụ oji nwayọọ egbu – Kọmishọna ahụike Steeti Anambra dọrọ aka ná ntị.

Chinwe Onuigbo, Awka dere ya na bekee.

0 257

Ọrịa na-anaghị efe efe bụ oji nwayọọ egbu – Kọmishọna ahụike Steeti Anambra dọrọ aka ná ntị

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra bụ Dọkịnta Afam Obidike akọwala ọrịa na-anaghị efe efe (NCD) dịka ogbu mmadụ nke a ga-ememina n’obodo.

Dọkịnta Obidike kwuru nke a n’ọzụzụ nke enyere ndi ga-azụkwa ndi ọzọ .E mere ya bụ ozuzu ụbọchị abụọ nke ndị otu AstraZeneca na Healthy Heart Africa haziri n’Awka.

Ọzụzụ a gụnyere ndị sonyere na Ministries of Health, Primary Healthcare Developments si Anambra, Imo, Enugu na Delta steeti.

Ọzụzụ a ndị na-azụ ndị ọkachamara ahụike gbasara ọrịa na-anaghị efe efe bụ ihe kwesịrị ịja mma nke ukwuu n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịkụziri ndị obodo anyị na e kwesịghị iwere ọrịa na-anaghị efe efe.

Leave A Reply

Your email address will not be published.