Take a fresh look at your lifestyle.

Liz Truss abụrụla onyeisiala mba UK

0 341

Ndị ọchịchị mba Uk akpọpụtala Liz Truss dịka onyeisiala ha.

Truss kelere ndị igwu na ibe ya nakwa ezinaụlọ nandị enyị maka nkwado ha nyere ya.

Ọ sị na ya ga-etinye anya maka ịme ka ọkụ bụrụ anyụanyụ na mba ahụ ma meekwa ka ọnụahịa nkụrụngwa daa pịapịa site na-ịwetu ụtụisi.

Truss ji ọkolọtọ Conservative zọọ ọchịchị ji vootu 57.4% merie Rishi bụ onye nwere bvootu dị 43% .

Ọ jakwara Boris Johnson bụ onye nyefere ya ọchịchị ike maka ịbuse covid-19 agha, ịkwụsị ike n’ọgụ Ukraine nakwa ihe ndị ọzọ.

Truss bụ nwaanyị ike atọ chigoro UK.

Ndị nke ọzọ bụ Magret Tatcher na Theresa May.

Truss ga-agazị dọrọ ike n’aka Ezenwaanyị Elizabeth tupu ọmalite ọrụ

Ihe i kwesịrị ịma maka onye ga-abụ Praịm Mịnịsta ọhụrụ nke mba UK

Gịnị ga-eme taa?

N’ihihie taa mgbe o ji ọkara gaa elekere iri na abụọ BST ka a ga-akpọpụta onye ga-anọchị anya Boris Johnson n’ogige Queen Elizabeth nke abụọ, akụkọ ụlọomeiwu dị n’akụkụ ogige Graham Brady bụbu onyeisioche kọmitii ndị omeiwu nke Conservative na 1922.

Onyeisi ahụ ga-agwa ọha okwu mgbe a kpọpụtachara ya, mana agaghị ajụ ya ajụjụ.

A gaghị anụ olu onye nke e meriri.

Onye meriri ga-abanye ọrụ ịchọta ndị ga-abụ minista ya, nakwado maka okwu mbụ ọ ga-akwa ọha bụ nke ga-abụ ụbọchị Tuzde.

Leave A Reply

Your email address will not be published.