Take a fresh look at your lifestyle.

Etu e si zọpụta nwa m a mụrụ na erughieru – Ogubuike

0 618

Ihe nwaanyị kwesịrị ibu afọ ime tupu ọ mụọ ya bụ izuụka iri atọ na asaa; ụfọdụ na-ebuzu nke ha izuụka iri anọ.                                            Mana Chioma Ogubuike mụrụ nwa ya oge afọ ime ya dị naanị izuụka iri abụo na anọ, nke pụtara na nwa ahụ akabeghi aka chaa chaa tupu a mụpụta ya.                                                                                                                                                                                                                                                                             Ndị dọkịta kwuru na ya bụ nwa agaghị adị ndụ, mana dịka Pantaleon Ogubuike bụ nna nwata ahụ si kọọrọ ndi ntaakuko, nwa ya nwoke dị ndụ ugbua ma nwee ahụ ike.

Ogubuike kọrọ etu o si buru nwa ya kpagharịa ọtụtụ ụlọọgwụ n’Owere Steetib Imo tupu ọ hụ ụlọọgwụ nke nabatara ha ma malite inye nwa ya ọgwụgwọ.

Dọkịnta Chinwe Muomalu ndị ọrụ ya gbara mbọ gbapụta nwata ahụ.

N’ezie, mbọ a gbara iji zọpụta nwata ahụ dịka mmadụ ịga gụta ọkụ na be ndị mmụọ, mana e mechara, zọta nwata ahụ ndụ. Kirie akụkọ a na-awụ akpata oyi n’ihe onyonyo dị n’elu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *