Nsonso a, ndị isi ụka Kraịsti na-adanyezị na ọtụtụ ntọrọ n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
Akụkọ ntọrọ ọzọ esila n’akụkụ okporoụzọ Okigwe gawa Enugu pụta taa bụ abali iri abuo na otu nke ọnwa Ọgọstụ, 2022.
Akụkọ a na-ekwu na a tọọrọ ndị sịsta ụka Katọlịk mmadụ anọ n’ụtụtụ ụbọchị ụka dịka ha nọ n’ụzọ a gaa ịka ụka.
Ihe a mere n’okporoụzọ a nke e jizi akụkọ ntọrọ ndị mmadụ were mara.
Cheta na ọ bụ n’akụkụ ebe ahụ ka a tọọrọ onyeisi ụka Metọdịstị na Naịjirịa bụ Prelate Samuel Kanu-Uche n’ọgwụ Juun.
N’ụzọ ahụ ka a tọkwara otu Fada ụka Katọlịk bụ Chinedu Nwadike n’izu gara aga.
Leave a Reply