Ndị a na-akpọ ndị Igbo bụ ndị bi na mpaghara ndịda Ọwụwa Anyanwụ Naijrịa.
Akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bụ ndị si ebe dị iche iche bịara nọrọ na mpaghara ahụ ma na-asịkwa na ọ bụ asụsụ Igbo bụ ihe jịkọrọ ha ọnụ.
Ugbua na Naijirịa, eji ịzụ ahịa na ịgbasi mbọ ike wee mara ndị Igbo, nke mere na ụfọdụ ndị na-akpọ ha ndị Juu nke Afrịka.
Mana mgbe gboo, e nwere ihe ọzọ e ji mara ụfọdụ obodo ndị a nke bụ ịlụ agha maọbụ ịkpa ike.
N’agbanyeghị na ọtụtụ akụkọ mere eme gbasara ndị Igbo bụ akụkọ a kọro n’ọnụ site na nne na nna ruo na nwa ha, ndị ọkaibe ihe mere eme mere nnyocha wee chọpụta etu ụfọdụ akụkọ ndị a si bụru ihe mere eme n’ezie.
Dịka ndị ọkaibe na ndị ihe mere eme maka ndị Igbo siri kọwaa, e nwere ụfọdụ obodo ndị eji ịkpa ike were mara ndị gụnyere:
- Arochukwu
- Ohafia
- Izii
- Ezza
- Ikwo
- Achi, dgz
- Abiriba
Ohafia
Ohafia bụ obodo nọ n’Abia Steeti nke dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa.
Obodo Ohafia na nke Arochukwu nwere otu oke.
Mazi Chigozie Nnabuihe bụ ọnye nkuzi Asụsụ na ihe mere eme maka ndị Igbo tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
O kwuru sị, “Agaghị m ekwu ihe ma na amaghị n’ihi na emebeghị m nyocha zuru oke maka ndị Ohafia, kama ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ọ bụ na mpaghara Idanre ka ndị ohafia siri fee oke were biri ebe ha nọ ugbua”.
O kwuru na enwebeghị nyocha siri ike kwadoro akụkọ a, ma sị na mbọ ọ gbara ịnweta efere egwu ‘Gramophone’ ndị Ohafia jiri kọọ ya bụ akụkọ amụtaghị mkpụrụ.
Nnabuihe kwuru na otu ihe eji mara ndị Ohafia bụ egwu agha ha a na-akpọ ‘Iri Agha’.
Ya bụ egwu bụ egwu eji amara dike oge ochie ma ugbua, ọ bụ ihe eji elegharịanya.
A na-agba egwu Iri Agha, a na-akọ akụkọ ihe mere eme nke na-ekwu etu ndị nnanna ha siri kpaa ike n’agha.
Obodo Achị
Otu onye ọnụ na-eru n’okwu maka ihe mere eme n’ala Igbo bụ Mcginger Ibeneme kọwara na ObodoAchi nke dị n’okpuru ọchịchị Oji River Enugwu Steeti taa bụ obodo ndị agbata obi ha na-atụ egwu oge gboo.
O kwuru sị, “ ha bụ ndị eji ịwakpo obodo ndị ọzọ mara ma bụrụ kwa ndị a na-akwụ ụgwọ ka ha lụchitere ndị obodo ọzọ ọgụ”.
O kwukwara sị, “ oge gboo, ọ bụ ndị siri ike na-ebi n’oke ala ha na mba ndị ọzọ nwere iji chekwaa ndị nke bi n’ime obodo”.
Ibeneme kọwara na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara na ndị Igbo na-asọ ịkwfu ọbra asọ nke pụtara na enweghị nnukwu ọgụ ndị Igbo lụrụ n’etiti onwe ha nke tara isi ọtụtụ mmadụ.
O kwuru sị, “ ihe Igbo na-akpọ agha bu mgbe otu obodo wakporo obodo ọzọ nara ha ala ha maọbụ ihe ha jiri biri”.
Ibeneme kwuru na izizi ndị ọcha bịara Achi, na ndị Achị lusoro ha ọgụ ma chụghachị ha azụ.
O kwuru sị, “Ndị ọcha mechara bịa ọzọ were sị ka ekpe udo n’ebe a na-akpọ ‘Ugwu Ntijiegba’, kama mgbe ụmụ nwoke ndị Achi pụtara, ndị agha ndị ọcha gbara ha gburugburu were gbuo ọtụtụ n’ime ụmụ nwoke ndịa”.
O kwuru na ndị ọcha napụrụ ha egbe ha niile were gbajie ya, ya mere ruo taa ndị Achị na-ekwu okwu asị, “ Ụbọchị Mcgregor gbara Achị”.
O kwuru na ihe a mere n’ihe dịka afọ 1902.
Ibeneme kọwara na ndị obodo Achị nwere ndị agha a na-akpọ “ ọga aga agwụagwụ ” maọbụ ụfọdu ebe na-akpọ nke ha “Ọ gaa nrinri” nke pụtara ‘Soldier Ant’ na bekee.
O kwuru sị, “kama ndị ọcha gburu ọtụtụ ụmu nwoke ndị Achị n’ugwu ntijiegba nke mere na ọnụ ọgụgụ ndị obodo Achị bịara pee mpe ma nye ndị ọcha ohere ị were ọnọdụ dịka ndị ọchịchị”.
Obodo Ezza
Obodo Ezza bụ obodo nọ n’Ebonyi Steeti nke dị n’ọwụwa anyanwụ Naijirịa taa.
Nwaafọ Ezza ma bụrụkwa onyeisi ndị omeiwu n’ụlọomeiwu nke Ebonyi steeti bụ Victor Uzoma Chukwu kwuru na ndị Ezza bụ ndị eji ịkpa ike mara oge gboo.
O kwuru sị, “Ezza bụ nwa izizi na ọpara mbụ nke ‘Ekumenyi, ụmụ nne ya ndị m chetara ugbua bụ Izii, Ikwo na Ezemagbo “.
O kwuru sị, “ Tupu ndị ọcha abịa, ụmụnwoke ndị Ezza na-akpụ ụzụ nke ọma”.
Chukwu kọwara na nke a nyere ha ohere ịrụpụta ngwa agha dịka egbe na ihe ndị ọzọ.
O kwuru sị, “ oge gboo nwoke niile n’Ezaa ga-enwerịrị ụzụ n’ụlọ ya”.
O gara n’ihu kwuo, “ Eji ịkpa ike mara ndị Ezza, ha na-alụrụ ndị mba ọzọ ọgụ nke mere na ị ga-ahụta ndị Ezza n’obodo dịka Isiagu dị n’Abia Steeti na obodo ndị ọzọ nọ n’oke Abia na Ebonyi steeti”.
Chukwu kọwara na ị ga-ahuta ndị Ezza n’obodo dịka Akwọga na Nkiriegi dị na Enugwu Steeti ma hụta kwa ha n’ụfọdụ ebe na Benue Steeti.
Mcginger Ibeneme tinyere ọnụ were sị, “ Ụmụ nwoke ndị Ezza oge ochie bụ ndị agha a na-akwụ ụgwọ ka ha lụchitere ndị ọzọ ọgụ, ha na-ebikwa n’oke ala n’etiti ha na obodo ha na-ese okwu iji chekwaa ndị bi n’ime obodo”.
Ọ kọwara na ndị Ezza nwere ndị agha ahaziri nke ọma.
Ọ kọwara na mgbe ha lụchara ọgụ na ndị obodo ahụ na-eji ala akwụ ha ụgwọ nke mere ha ji biri ebe ahụ.
Leave a Reply