Take a fresh look at your lifestyle.

Ụmụ nwoke ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike ịbụ ‘Super Model’

0 458

Ụfọdụ ụmụnwoke ndị ndọrọndọrọ mara nma pụrụ iche.

Oge ndọrọndọrọ ebirila ọkụ na gburugburu Naịjirịa dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa Onyeisiala, Gọvanọ nakwa ụlọomeiwu dị icheiche n’afọ 2023.

N’oge a, e nwere ndị a ma ama aha ha na-ewu maka ndọrọndọrọ ma nwee ndị ọzọ aha ha na-ewu maka ịchabanye ụmụnwaanyị n’anya.

Ihe ndị a ji bụrụ ọpụrụiche ebe ndị ọzọ nọ gụnyere mma nwoke ha, ogo ha toro nakwa etu ha sị acha.

Igbo na-ekwu na “ahụ dimkpa ahụ ogologo imi ya”, soro anyị n’akụkọ a ka anyị gosi gị ndị bụ olu gbajie ‘girls’.

Osita Chidoka, afọ 51

Osita Benjamin Chidoka a ma dịka Ike Obosi bụ otu onye na-amasị ụmụ nwaanyị.

Ọ bụ onye Obosi dị n’Idemili North Anambra steeti.

Ọ bụbu Minista njem ụgbọelu n’okpuru Olusegun Obasanjo ma mechaa bụrụ onyeisi na-elekọta ngalaba ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ.

Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ n’afọ 2017 mana Willie Obiano nke APGA meriri ya. O nwebeghi ọkwa ọ na-azọ ugbua.

Idris Ajimobi, afọ 34

Idris Ajimobi bụ naanị nwa nwoke aka chịbụrụ Oyo steeti bụ Abiola Ajimobi mụtara.

O si Ibadan bụ isi obodo Oyo steeti.

Idris gụrụ akwụkwọ na mba ofesi ma laghachite malite ụlọọrụ ya na-ere ma na-elekọta ụlọ na ala.

Ọ lụrụ nwa ikpeazụ Gọvanọ Kano steeti bụ Umar Ganduje akpọrọ Fatima Ganduje ma zọta ikike ịnọchị anya otu APC n’ụlọọmeiwu steeti Oyo.

Chima Obieze, afọ 39

Chima Emmanuel Obieze bụ ọkwaiwu si Akama-Oghe dị n’okpuruọchịchị Ezeagu dị n’Enugwu steeti.

Dịka o si kọ, ọ tara ahụhụ mgbe ọ na-etolite n’ihi na nne na nna ya enweghi ego mana ọ gbalịrị mepụta onwe ya ihe.

Ugbua ọ bụ onye omeiwu nọchitere anya mpaghara Ezeagu ma bụrụkwa onyeisioche Kọmiti ndị ụlọomeiwu na-elekọta ụlọ na ala.

Gbadebo Rhodes-Vivour, afọ 38

Gbadebo Rhodes-Vivour bụ onye ji ego achụ ego zọburu ọkwa dị icheiche na Legọs.

Nna ya bụ ọkaikpe a ma ama bụ Bode Rhodes-Vivour lara ezumike nka ugbua.

Ọ malitere njem ndọrọndọrọ ya na KOWA pati mgbe ọ zọrọ onyeisioche okpuruọchịchị Ikeja.

Ọ mechara banye PDP ebe ọ zọtara ikike ife ọkọlọtọ ha n’ịzọ oche ụlọomeiwu ukwu n’afọ 2015.

Ọ pụtara ịzọ ikike iji aha PDP zọ ọkwa Gọvanọ Legọs steeti mana ọ mechara pụọ n’otu ahụ banye n’otu Labour Party ịzọ otu ọkwa ahụ.

Bankole Wellington, afọ 41

Bankole Wellington bụ otiegwu a ma dịka ‘Banky W’ si n’iti egwu zọwa ọkwa.

O malitere iti egwu kemgbe afọ 2002 ma mepekwa ụlọegwu nke ya akpọrọ ‘Empire Mates Entertainment’ bụ E.M.E.

Ọ lụrụ omeeiheonyonyo bụ Adesuwa Etomi n’afọ 2017.

O bu ụzọ kwuo na ọ ga-azọ nnọchi anya Eti-Osa Federal Constituency n’ụlọomeiwu nta n’okpuru otu Modern Democratic Partu n’afọ 2018 nke Babajide Obanikoro meriri ya na ya.

Ugbua ọ na-azọ otu ọkwa ahụ mana ọ bụ n’okpuru otu PDP dịka ọ ritere ikike iji aha ha zọ ya bụ ọkwa n’ọnwa Juun afọ 2022.

Ibenaku Onoh, afọ 35

Ibenaku Onoh malitere iwu mgbe ọ bụ onye kachasị dị na nwata zọtara ọkwa n’ụlọomeiwu Enugwu steeti.

Ọ bụ ọkaiwu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka. Onoh ruburu ọrụ na ụlọakụ etiti bụ Central Bank tupu ọ zọọ ma banye n’ọkwa.

Ọ zọtara ikike ịnọchi anya otu PDP n’ụlọomeiwu Enugu steeti nke o meriri n’afọ 2019.

Onoh na-azọgharịkwa ọkwa ya ọzọ na ntuliaka na-abịa n’afọ 2023.

Umar Ganduje, afọ

Umar Ganduje bụ nwa Gọvanọ na-achị Kano steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje.

Ọ bụkwa ọgọ nwoke Idris Ajimobi na-alụ nwanne ya nwaanyị nke obere.

Ganduje esorola nzọmụkwụ nna ya site n’ịzọ ọkwa n’okpuru otu APC nke o ritere ikike ya na ntụliaka imeụlọ e mere n’ọnwa Mee.

Ọ na-achọ ịnọchị anya Tofa, Rimin Gado, Dawakin Tofa n’ụlọomeiwu nta maọbụrụ na o merie na ntuliaka na-abịa n’afo 2023.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.