Take a fresh look at your lifestyle.

Etu m si eji ihe na-emetọ obodo eme ka obodo maa mma

0 884

Collins Asiegbu bụ nwa okoroọbịa na-eji mkpakara igwe na ọkụ emepụta ihe nka mara mma.

Asiegbu onye Anambra steeti gụrụ ‘Fine and Applied’ arts na mahadum Nnamdi Azikiwe nke dị n’Anambra Steeti.

Ọ gụchara mahadum n’afọ 2014.

 

Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ oyibo kama ọ mechara kwụsị dịka obi ya nọ n’ihe nka, ọkachasị nke e ji ọkụ na igwe arụpụta.

Ya bụ nka e ji ọkụ na igwe arụpụta ka a na-akpo ‘Iron works’ na Bekee.

Asiegbu kwụrụ sị, ” Ọ bụ ihe mkpakara igwe ndị mmadụ tufuru atufu ka m na-eji arụpụta ihe nka m na-eme”.

Ọ gara n’ihu kwuo, ” kama ihe ndị a ga-emerụ mmadụ ahụ maọbụ butere mmadụ ọrịa, ana m ewere ya gbado ya ọkụ ma mepụta ihe nka ndị a”.

Asiegbu kwuru na ihe na-echere ya aka mgba bụ enweghị ọkụ latrik na ego e ji azụta mmanụ ụgbọala nke igwe ọkụ jị arụ ọrụ.

O kwuru na nka bụ ihe o ji egosi ndị ọdịnịhụ etu ndị agba nke a ugbua siri bie ndụ ha.

Ọ bụ Chiemela Mgbeahụrụ na Chigozie Ohaka mere akụkọ a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *