Take a fresh look at your lifestyle.

NLC emeela ngagharịiwe ịkwado abụbụ ọrụ ndị ASUU

0 596

Otu jikoro ndị ọrụ oyibo niile na Naịjirịa bu Nigeria Labour Congress, NLC, emeela ngagharịiwe ha kwere na nkwa iji kwado abụbụọrụ ndị Academic Staff Union of Universities (ASUU) na-agba kemgbe ọnwa anọ ugbua.

ASUU na-esi ọnwụ ka gọọmentị Naịjirịa tinyekwuoro ha ego n’ụgwọ ọnwa ha ma wepụta ego dozie ụlọ akwụkwọ mahamadu niile na Naịjirịa.

NLC kwuru na ha ga-eme ya bụ ngagharịiwe na Naịjria niile taa bụ Tuesday.

Gọomentị Naịjirịa dọrọ NLC aka na ntị ka ha ghara ịme ngagharịiwe ahụ maka ndị omekome ijiri ohere ahụ mebie ihe.

Mana ha gbara isi akwara na ha ga-eme ya ma mejuputakwa ya bụ nkwa ha kwere ọnwe ha taa,

Na steeti ụfọdụ ndi ntaakụkọ hụrụ, ya bụ ngagharịiwe n’aga n’ihu, ọkachasị na Port Harcourt, Owerri, Abakaliki, Enugu, Awka nakwa Aba.

N’Ụmụahịa, ndị ọrụ pụtara ịme ya bụ ngagharịiwe nwetara akwụkwọ ndị uweojii deere ha na ha akwadoghị ya bụ ngagharịiwe maka na ndị ajọ mmadụ nwereike iji ohere ahụ mebie ihe.

Onyeisi ndị NLC bụ Uchenna Obigwe bụ onye gụpụtara akwụkwọ ndị uweojii ahụ n’ụlọọrụ ya Umuahia gwara ndị otu ha na ọka mma ime ya bụ ngagharịiwe n’Abuja.

O tikwara mkpu ka ụmụaka siri nọrọ n’ụlọ kemgbe.

Ka nke a na-aga, otu jikọrọ ụmụaakwụkwọ n’Aba, Abịa steetị, kpọrọ onwe ha Free Abia Movement gwara ndị ntaakụkọ okwu taa n’Aba.

Otu a katọrọ ihe ha kpọrọ ajọ agwa gọomentị steetị ahụ na-akpaso ndị nkụzi n’ụlọakwụkwọ ukwu anọ nke gọọmentị steetio ahụ nwe.

Ụlọakwụkwọ ndị a bụ Abia State Polytechnic, Aba, Abia State College of Health Management, Abia State University (ABSU), Uturu na Abia State College of Education Technical, Arochukwu.

Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ha enweghịzi ntụkwasịobi n’ebe gọomentị Okezie Ikpeazu nọ.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.