Ụlọ ọgwụ ọkachamara Sokoto na-anata N347m maka nrụzigharị inye akụrụngwa ọgbara ọhụrụ.
Kamila Bello dere ya na bekee.
Ụlọ ọgwụ ọkachamara Sokoto na-anata N347m maka nrụzigharị.
Gọọmenti Sokoto steeti akwadola nde naira 347m maka ndozigharị na inye akụrụngwa ọgbara ọhụrụ n’ụlọọgwụ ọkachamara dị na steeti ahụ.
Dọkịnta Nuhu Maishanu bụ onye isi nke ụlọọgwụ ahụ kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Sokoto.
Dị ka ya si kwuo, e nyere nkwado ahụ dabere na ọrụ kpọmkwem iji mee ka ọ dị mfe imecha nrụzigharị na inye ngwá ọrụ.
Ọ gbakwụnyere na ka emechara nrụzigharị ahụ, ụlọ ọrụ ahụ ga-emezu ụkpụrụ niile achọrọ n’ụlọọgwụ ọkachamara.
Leave a Reply