Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Delta steeti ekwela nkwa ijeri naira iri abụọ na ise.

0 440

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi Delta bụ Maazị Charles Aniagwu ekwuola na gọọmenti steeti ahụ ekwela ka ego nbinye ụlọ akụ Central Bank of Nigeria (CBN) Agric nke ijeri naira iri abụọ na ise maka ọmụrụ nwa.

Kọmishọna na-eso onye ode akwụkwọ mgbasa ozi nke Gọvanọ bụ Maazị Olisa Ifeajika kwuru nke a n’ọgbakọ ndị nta akụkọ n’Asaba.

“Ijeri naịra iri abụọ na ise bụ ego CBN nyere ndị ọrụ ugbo nọ na steeti ahụ aka ịbawanye ihe ha na-amịpụta, ọkachasị n’ihe gbasara nkwụ mmanụ na steeti ahụ. Ọ bụ ihe nkịtị na gọọmentị steeti na-ekwe nkwa mbinye ego ahụ dịka a na-eme n’oge ndị ọzọ iji hụ na ndị edepụtara maka mbinye ego ahụ nwetara ya nakwa na ha nwere ikike ịkwụghachi. Anyị abanyela n’ụlọ ọrụ nbinye ego iji mee ka ndị ọrụ ugbo anyị nweta ọmụrụ nwa otu mkpụrụ ego (ihe na-erughị 10) maka ndị ọrụ ugbo nwere profaịlụ. Anyagwu kwuru na mbinye ego a n’ugbo dị na steeti ahụ bụ Ministri na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ nke kọwara ndị ọrụ ugbo na ndị mmadụ ka ha rite uru na mbụ, na nke a, anyị na-enye ndị obodo anyị ike.

Ọ kwukwaziri na gọọmentị steeti ahụ enwetabeghị ego ijeri naira 150 nke ọ chọrọ nkwado n’aka ụlọ omebe iwu steeti ahụ.

Adigwu kwukwara na ọchịchị Gọvanọ Okowa na-edu ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ ruo ụbọchị ikpeazụ n’ọchịchị iji wetara ndị steeti ahụ mmepe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *