Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Naijiria ekwela nkwa ịkwụsị ọrịa etuto enwe (Monkey pox )- Minista.

0 26


Gọọmenti Naịjirịa kwuru n’ụbọchị Sọnde na ha etinyela usoro niile ha ga-esi leba anya na igbochi ọrịa enwe nke na-ebute nchegbu gburugburu ụwa.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Dọkịnta Osagie Ehanire kwuru nke a na mmemme mmalite nke ụlọọgwụ nkuzi mahadum Usmanu Danfodiyo, Sokoto mere.

Gọọmenti na-eleba anya na ntiwapụ a ma na-agba mbọ iji mee ka ọha na eze mara ọrịa a na otu esi egbochi mgbasa ya.

O kwuru na ọchịchị onye isi ala Muhammadu Buhari na-edu na-agba mbọ ime ka usoro nlekọta ahụike dịkwuo mma na mba ahụ.

“Nke a bụ nkwa imezu ụkpụrụ kachasị elu a chọtara n’ebe ndị ọzọ n’ụwa, n’ihi na ọ bụghị onye ọ bụla nwere ọchịchọ ma ọ bụ ụzọ iji gaa mba ọzọ maka ọgwụgwọ.

Leave A Reply

Your email address will not be published.