Aka n’achi Steeti Benue bụ,Samuel Ortom na onye chiburu Steeti Benue bụ, Gabriel Suswam enwetala nmeri n’ntuliaka imeụlọ nke otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party, PDP mere maka mpaghara Benue North West na North East Senatorial Zones.
Ha nwetara nmeria dika ndi deligati sina ime okpuru ọchichi asaa ha nwere na mpaghara ahụ kwekoritara na ọbụ ga anọchite anya ha.
Gọvanọ Ortom na Sineto Suswam buzi ndi ga azọ ọkwa oche sineti n’okpuru otu ndọrọndọrọ PDP.
Ortom kelere ndi otu ndọrọndọrọ ya maka inye ya ohere ije nnọchite anya ha na ụlọ omiwu sineti ma ọchicha dika Gọvanọ.
“Ndi Steeti Benue,nke ka nke ndi mpaghara North-West,egosila ezi nkwado nye mu. Enwghim ihe m ga eji ku unu ụgwọ kama ibu onye odibo unu, ” Gọvanọ Ortom kwuru.
Ntuliaka imeulo nke otu PDP kana aga n’ihu ka odi ugbua na otutu ebe na steetia maka ufodu nsogbu.
Leave a Reply