Take a fresh look at your lifestyle.

Gọmenti Enugwu na Ebonyi akatọọla ogbugbu egburu mmadụ iri n’Anambra state ụbọchị ụka

0 494

Ogbugbu egburu otu nwaanyi na ụmụ ya anọ n’Ajali dị n’okpuru ọchịchị Orumba bụ nke na-agba nnukwu anya mmiri ugbua.

Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ wakpokwara ọtụtụ ebe n’Anambra gbukwaa mmadụ isii, nke wetara ọnụ ọgụgụ ndị e gburu rue mmadụ iri.

Ndị ọnụ na-ekwuchitere gọmentị Ebonyị na Enugwu ji onu iwe katọọ ogbugbu ahụ dịka ihe jọgburu udene ma sigbuo nkapị.

Kọmishịọna na ahụ maka mgbasa ozi n’Ebonyi Steeti bụ Mazị Uchenna Orji kwuru na ọ dị mkpa ka gọmenti ọwụwanyanwụ tinye anya na mmiri, kpọkọba ndị ntorobịa mara ihe bụ iwe ha.

Orji nyere ndụmọdụ ka obodo ndị ọzọ ṅomie ka Ebonyị si arụ ọrụ nchekwa dịka iji “ebube agụ”, imata onye ọhụrụ ọbụla batara n’obodo nakwa ịjụ ndị Igwe ihe na-eme na gburu gburu ha.

Ogbo ya bụ ọnụ na ekwuchitere Enugwu steeti bụkwa onye ndụmọdụ nye gọmenti Enugwu bụ steeve Orụrụa ji anya mmiri kwuo na ndị igbo bụ ndị na asọ ikwafu ọbara nsọ, bụrụkwa ndị e ji udo na onye aghana nwanne ya mara.

Mana ugbua Orurua kwara arịrị na oge eruola mgbe Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị ọchịchị ime ime obodo ga-anọrọ ọdụ, kpọkọba ndị ntorobịa ma yọọ ha ka ha kwụsị ikwafu ọbara.

Etu ‘unknown gunmen’ si gbuo nwaanyị dị ime, ụmụ ya anọ na ndị ọzọ n’Anambra n’abali iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee

Cheta na abalị abụọ gara aga ka Iru uju na arịrị na-afịọ n’etiti ndị Ugwu bi n’Ọwụwa anyanwụ dịka ndị omekome bu egbe gburu opekata mpe mmadụ iri , ọtụtụ n’ime ha bụ ndị si Ugwu Naijiria na mwakpo mere ebe dị iche iche n’Anambara steeti n’Ụbọchịụka.

Ndị omekataraihepụjọ gburu mmadụ gụnyere nwaanyị dị ime na ụmụ ya anọ, otu onye inginia, ndị na-ere suya, ndị ọkwọụgbọala, ọkwọ ọgbatumtum na ndị na-arụ akpụkpọụkwu n’Ọnịcha, Adazi NnukwuAjali, Ogidi, Nanka.

Nke a na-abịa nanị ka ọ gachara otu abalị e jiri gbuo onye omeiwU nke Steeti ahụ bụ Okechukkwu Okoye ,bepụ ya isi ma tọgbọọ isi ya n’otu obodo, ahụ ya n’obodo ọzọ.

Mbọ nile ndi ntaakụkọ Igbo gbara inweta olu ndị uweojii Anambara steeti amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga zara ekwentị mana o kweghị asa okwu n’okwu mkpamkpa nile kpara na Anambra steeti.

Onye ma nwaanyị ahụ dị ime gwara ndi ntaakụkọ na nwaanyị ahụ bụ onye okpuru Ọchịchị Ganye dị n’Adama steeti si Akpo gaa ileta ụmụnne ha bi n’Ajali na-ala, ya na ụmụ ya oge ndị ojiegbe bu ụgbọala zutere ha.

Onye ndu otu jikọrọ ndị Ugwu ma bụrụkwa onye ma nwaanyị ahụ achọghị ka a kpọ aha ya gwara ndi ntaakụkọ kwuru,”Ha ji ụgbọala kutuo nwaanyị ahụ na onye ọkada bu ya.”

“Onye ọkada ha gbara ọsọ ndụ gbaba bee mmadụ.

“Ha gbagburu nwaanyị ahụ dị nnukwu ime, gbagbuo ụmụ ya anọ”.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ụmụ anọ ndị ahụ e gburu dị agbata afọ 9 rue14.

Ndị ojiegbe e gbukwara mmadụ n’Adazi Nnukwu,Ogidi,Nanka, na Abatete.

N’Adazi Nnukwu

N’Adazị Nnukwu dị n’Okpuru Ọchịchị Aniocha, ndị ojiegbe ahụ gburu mmadụ atọ, gba ọgbatumtum ise ọkụ.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara ndi ntaakụkọ na e gburu Rabiu Adamu, onye Jada na Adamawa steeti, ,Kabiru, onye Nijie, na otu onye ọzọ sikwa Jada n’Adamawa amabeghị aha ya.

Onye Ugwu gwara ndi nta akụkọ Igbo na ” ndị ahụ bu ụgbọala bia, ndị ọkada nille gbara ọzọ hapụ ọgbatumtum ha.”

“Mana ha gburu mmadụ atọ nọ ebe ahụ amaghị ihe na achụ ndị ọkada na-agba ọsọ.”

Ọ gara n’ihu kọwa na ndị mere ihe ahụ na-agwa ha, “Na lọckdown dị echi.” oge ọbụla a na-eme lockdọwn, ụnụ na-apụta”.

Nke a bụ iji gwa ụnụ na ‘lọckdown dị echi.”

N’Ogidi,

Akụkọ kwuru na ndị omekome kpakwara mkpamkpa n’Ogidi, Anambra steeti.

Otu onye Ogidi achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndi ntaakụko Igbo na e gburu “otu nwoke onye Ugwu na ‘Nkwelle Junction na nso Ogidi n’ụbọchịụka.

Nanka, Orumba North

Na Nanka ha gburu otu nwoke onye Sokoto steeti na-ere suya .

Onye be ha gwara ndi ntaakụkọ, “Ha bịakwutere ya ebe ọ na-ere suya n’ihe dịka Elekere ise nke mgbede, gburu ya, kposaa suya ọ na-ere.”

“Ozu ya dọ ebe e gburu ya kemgbe ụnyahụ n’ihi na e nweghị ngagharị taa bụ Monde”.

N’Abatete

Na Abatete, ndị ojiegbe bu ụgbọala Hilux abụọ gburu onye na-ere suya nakwa onye na-arụ akpụkpọụkwụ.

“Ha gburu ha, ghafuo suya”.

Cheta na nsonso a, gbuogbuo na-arị elu n’Ọwụwa Anyanwụ ọkachasị n’Anambra steeti bụ ebe e gburu onye omeiwu steeti ahụ bepụ ya isi.

Gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa na-arụ ndị otu Ipob aka maka oke ogbugbu mmadụ na-eme mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *