Ndi regional gọvanọ anọ agbala arụkwaghim n’ụbọchi Tuuzde,dika obodo ha na enwe nsogbu ọnọdu akụlụba ma nmachi amachiri ha.
Ndia si mpaghara Tomsk, Saratov, Kirov na Mari El regions kwuputara na ha n’agba arụkwaghim,ebe onye nke mpaghara Ryazan region kwuru na ya agaghi ọzọ ọkwa ọzọ.
Ndi gọvanọ n’esighi ike ka ana achụpụkari n’ọrụ site na ikwa ha ka ha gba arụkwaghim.
Onyeisi Centre for the Development of Regional Politics think tank na Moscow bụ, Ilya Grashchenkov kwuru na, “ Kremlin n’achụpụ ndi gọvanọ n’enweghi ike nke ga eme ka ọnọdu akụlụba diwanye njoo n’obodo,tụmadi nmachi amachiri ha.
“Ọ di mkpa imeghari ọnọdu akụlụba,nke ka nke mpaghara ebe ndi gbakwasiri ukwu na ihe si mba ọzọ.Ekwesiri idochi ndi gọvanọ a site nan di ọhụrụ,” ka okwuru.
Ọnọdu akụlụba mba Russia dina aka ndi ngo di pacenti 8.8% n’afọ 2022, dika onye minista n’ahụ maka ọnọdu akụlụba si kwuo.
Leave a Reply