Take a fresh look at your lifestyle.

Gọomentị Briten akọwala okwu gbasara inye nchekwa

0 623

Gọọmenti mba UK ekwuola na otu Indigenous People of Biafra abụghị otu oyi egwu nke bekee kpọrọ ‘terrorist’ na mba ha.

Ha kwuru na akụkọ na-efegharị na gọọmenti UK etinyela otu Ipob n’akwụkwọ ebe ha depụtara ndị oyi egwu bụ akụkọ ụgha.

O kwuru na akụkọ ụgha ahụ gbadoro ụkwụ n’ozi ha depụtara na webusait ha nke isiokwu ya bụ 13 April 2022 publication by the UK Government of

a revised Country Policy and Information note (CPIN) on separatist groups in SE Nigeria, nke gụnyere otu Ipob.

Dean Hurlock bụ onụ na-ekwuru UK High Commission dị n’Abuja depụtara nkọwa ọhụrụ n’akwụkwọ ozi o zitere BBC Igbo.

Gọọmenti UK kọwara ozi ahụ n’ụzọ atọ a

  • Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na Country Policy and Information note(CPIN) bụ atụmaatụ nke gọọmenti Britein ji ahazi udi nchekwa nakwa mkpesa mmegbu dị iche iche.

“Mba UK na-elebanya na mkpesa ọbụla metụtara ịgba ọsọ ndụ nakwa nke mkpagbu n’otu n’otu n’usoro UN Refugee Convention and European

Convention on Human Rights kwadoro, mabụrụkwa n’obi ozi maọbụ etu iwu mba ọbụla si dị,” bụ ihe akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

  • CIPN nke metụtara otu ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ gụnyere Ipob , pụtara nlebanya na mkpagbu dị iche iche ndị niile nọ n’otu ahụ na-agabiga.
  • CIPN kwetere na gọọmenti Naịjirịa amachiela otu Ipob dịka otu na-eyi egwu, ụfọdụ ndị otu Ipob bụ ndị ji ụzọ tigbuo zọgbuo so mba ha nakwa ndị bi na ya ma na-enye ndụmọdụ na onye ọbụla kpagburu mmadụ ibe ya agaghị enweta nchekwa ọbụla.

Lekwa akwụkwọ ozi nkọwa ahụ ebe a

Screengrab

Ihe gọọmenti Briten hazigharịrị ọhụrụ a na websaiti ha maka inye ‘Asylum’

Cheta na gọọmentị mba Briten deghariri usoro ha si enye ndị otu Indigenous Poeple of Biafra (Ipob), otu Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (MASSOB) nakwa ndị niile ha na ha nwere mmekọ ‘asylum’ na mba ha.

Ha depụtara nke a n’ọbaozi websaịt ha n’ọnwa Maachị bụ nke ha degharịrị n’ụbọchị atọ nke ọnwa Mee.

Mkpebi ha gbadoro ụkwụ n’Iwu mbaụwa niile a kpọrọ ‘1951 Refugee Convention‘ nke gbochiri onye ọbụla megidere ikike ruru mmadụ n’ịgba ọsọ ndụ.

Mana ha kwuru na ndị mmadụ ghọtaghiere ha, nke mere ka gọọmenti UK depụta akwụkwọ ọzọ na-akọwa okwu ahụ n’ụzọ doro ewu na ọkụkọ anya.

N’ime ozi ahụ, ha sị na “onye ọbụla a chọpụtara na o so n’otu Ipob, Massob nakwa otu Biafra ndị ọzọ na-agbasa ozi ga-ebute ịkpaoke, tigbuo zogbuo agaghị enweta ‘asylum’ na be ha”.

Ha kọwara na otu Ipob bụ oru nke gọọmentị Naịjirịa denyere dịka otu na-eyi ndụ egwu dịka ha na-egosi ihe ndị mere ha ji machie ndị otu ha ịgbata ọsọ ndụ na mba ha.

Odobeghi anya ma iwu a ọ ga-emetụta ndị otu Ipob na Massob bi na mba Briten, maọbụ metụta ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ chọrọ ịga zụọ ahia, gụọ akwụkwọ maọbụ mee otu ihe na nke ọzọ na mba Briten.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *