Take a fresh look at your lifestyle.

Ụzọ ị ga-eji zụọ ụmụ gị na-abụghị sọ ịpịa ụtalị.

0 777

Inye ụmụaka ihe ha hụrụ n’anya dịka nri, ihe egwuregwu ụmụaka, akwa, akpụkpọụkwụ nakwa ihe ndị.

Ịnapụ ụmụaka ihe ha chọrọ dịka ihe egwuregwu ụmụaka, akwa, akpụkpụ ụkwụ nakwa ihe ndị, ihe ejije egwuregwu ụmụaka (cartoon) nakwa ihe ndị ọzọ Enefoh kwuru na ihe kacha mkpa bụ ndị na-azụ.ụmụaka iwepụta oge mara ụmụ ha na-azụ ma hibere usoro ọzụzụ ga-amịta mkpụrụ ha chọrọ n’ihe ụmụaka dị iche n’ụdị n’ụdị.

Nwaada Okeke kwuru na ndị nne na nna inwe mwukọrịta kwa mgbe kwa mgbe nke gụnyere ikwupụta na ihụrụha n’anya na-enyere aka imeda mmụọ ha ma mee ka ha hapụ ịnụpụ isi nke ukwu.

Nwaada Okeke kwuru na ịmalite na mgbe ụmụaka ka dị nwata na-amakọ ha, na-emetụ ha aka dị ndị ịhụrụ n’anya nakwa igwa ha okwu dịka ndị ikwanyere ugwu na-enyere aka n’ọzụzụ.

Adamatie kwuru na ito ụmụaka, kụọrọ ha aka, maọbụ nye ha ihe nrite ma ha mete nke ọma na-eme ka ụmụaka gbaa mbọ imere ihe ọma na-aga n’ihu

O kwukwara na ime ka ụmụaka mesapụ ahụ n’akụkụ ndị na-azụ ha bụ ezi ụzọ ịhụ ime mmụọ ha kpọm kwem nke iti ihe na-egbochi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *