Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria ga-eziga ndị ọrụ ugbo na-eto eto di 200 na Israel na Morocco maka ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

0 556

 

Gọọmenti Naijiria site na National Land Development Authority (NALDA) ga-eziga ndị ọrụ ugbo na-eto eto 200 na Israel na Morocco maka ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ ụbọchị isii gbasara ọrụ ugbo Greenhouse na usoro anụ ụlọ ọgbara ọhụrụ.

Nke a dabara na mbọ gọọmentị na-agba n’oge na-adịbeghị anya ịhụ na ndị ntorobịa na-etinye aka n’ọrụ ugbo.

Ọzụzụ a bụ akụkụ n’aga n’ihu nke National Young Farmers Scheme, (NYFS), mmemme nke onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara oge gara aga.

A na-achịkọta ndị ntorobịa 200 ahụ ụzọ abụọ nke 100, otu otu ga-aga Israel maka ọzụzụ gbasara nlekọta Greenhouse na usoro mmepụta ihe ọkụkụ kwesịrị ekwesị ebe 100 ndị ọzọ ga-aga Morocco maka ọzụzụ gbasara ịzụ anụmanụ na nhazi anụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *