Take a fresh look at your lifestyle.

Onye bụ Charles Ugwuh EFCC nwụchiri maka ego N3.6bn?

0 144

Ndị ọrụ Economic and Financial Crimes Commission bu EFCC nke Legọs kwuru na ha anwụchiela onye bụbu mịnịsịta nke azụmahịa na mmepụta ihe bụ Charles Chukwuemeka Ugwuh maka mpụ na nrụrụaka ruru ijeri naịra ato na uma isii.

Na mgbasaozi EFCC depụtara na webụsaịtị ha, ha kwuru na ha nwụchiri Ugwu na Geoffrey Ekenma n’abalị iri na otu nke onwa Jenuwarị, 2024 n’Owere site na mkpesa otu ụlọkaụ ọgbaraọhụrụ degara ha nke rụrụ Ugwuh aka na o ji ụlọọrụ Ebony Agro Industries eme mpụ.

Na nyocha ha mere, ndị EFCC kwuru na ha chọpụtara na Ugwuh na Ekenma bitere ego n’ụlọakụ iji wee mepụta osikapa.

Mana ha enweghi ike imezu nkwa ndị ha kwere ụlọakụ ma ha akwụlighikwa ụgwọ ha ji.

Dịka akwụkwọ mgbasaozi ahụ siri kwuo, ndị EFCC na-eme nyocha banyere ya.

Onye bụ Charles Ugwuh?

Charles Ugwuh bụ ịnjinia a mụrụ n’abalị 3 ọnwa Disemba afọ 1942.

Ọ nọ na pati People’s Democratic Party ma rụọ ọrụ dịka mịnịsịta azụmahịa na mmepụta ihe dị n’aka malite n’afọ 2007 ruo afọ 2008.

A mụrụ ya n’okpuru ọchịchị Obowo n’Okigwe Imo Steeti.

Charles Ugwuh nwetara nzere ‘masters’ n’agụmagụ injinia na mahadum Birmingham nke mba Briten.

Ọ malitere ụlọọrụ a na-akpọ Rokana Indusitries and Hydro Resources Industries Limited nke dị n’Imo Steeti.

Ọ bụrụ onyeisi otu ndị na-emepụta ihe na Naịjirịa bụ Manufacturers Association of Nigeria.

N’okwu ya n’afọ 2003, o kwuru na ndị na-emepụta ihe na Naịjirịa adịla njikere ijiko aka ọnụ ha na ndị mba ndị ọzọ dị icheiche.

Ugwuh zọrọ ntuliaka imeụlọ ọkwa gọvanọ nke Imo steeti na pati ya bụ PDP n’afọ 2006 mana o merighi, ọ gbara onye nke iri ebe Ararume meriri mana PDP mechara kpọpụta Ugwuh ka onye ga-ebu ọkọlọtọ ha.

Ararume anabataghị nke a ma gbaa akwụkwọ nke mere e jiri bunyekwa Ararume ọkọlọtọ pati PDP ahụ.

O mechara bụrụ onyeisi pati PDP na steeti ahụ malite n’afọ 2020 ruo ugbua.

Njem Ugwuh na Mịnịstrị

Onyeisiala Umaru Musa Yar’Adua họpụtara Charles Ugwu ka mịnịsịta okwu azụmahịa ma mmepụtaihe dị n’aka n’abalị iri abuo na asaa ọnwa Julai afọ 2007.

N’ime ọnwa Sepụtemba afọ ahụ, Charles duru ndị Naịjirịa gaa mba Chaịna maka ọgbakọ “Nigeria-China Business and Investment Forum.

O kwuru na mba abụọ ndị ahụ ga na-agbaso mmekọrịa n’azụmahịa.

N’ọnwa Oktoba afọ 2008, onyeisiala Yar’Adua chụrụ ndị mịnịsịta mmadọ iri abuo n’obi ya nke gụnyere Charles Ugwuh.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *