Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ka ikpe Godwin Emefiele na ndị DSS si aga

0 157

Ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja enyela Gọọmenti Naịjirịa iwu ka ha kwụọ onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele, otu narị nde Naịra (N100 million) iji tie ya aka n’obi maka mkpụgharị ha kpụgharịrị ya nke megidere ikike o nwere dịka mmadụ.

Ha nyere iwu sị anwụchila Emefiele ọzọ.

Ụlọikpe kwuru na njichi ejichiri Emefiele ogologo oge na-ebughị ụzọ nata ikike ụlọikpe bụ nke na-ekwesighị ekwesị.

Mkpebi a sitere n’akwụkwọ Emefiele degaara ụlọikpe maka nnwụchi ndị ọrụ DSS nwụchiri ya bụ nke megidere ikikere ya dịka mmadụ.

Ọ sịrị ụlọikpe gwa ndị ha na ya nwere okwu ka ha kwụọ ya otu ijeri Naịra (N1 bn) iji tie ya aka n’obi ma nye iwu ga-amachi ha ịnwụchi ya ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *