Take a fresh look at your lifestyle.

Etu NDLEA si nwuchie onyeisi ndí na-ebu ọgwụ ike maka ọgwụ ike karịrị otu ijeri naira

0 152

Ngalaba na-ebu agha megide ọgwụ ike na Naijiria bụ NDLEA n’ịchafụ anwụchiela otu nwoke Interpol na-achọ kemgbe afọ 17 maka ibu ntụ.

A nwụchiri Ogbonnaya Kevin Jeff n’ebe o zoro na mpaghara Ojo dị na Legọs, dịka NDLEA si kwuo ụbọchị Monde.

Onyeisi NDLEA bụ Buba Marwa gwara ndị ntaakụkọ na Ogbonnaya gbara afọ 59 na-alakọrọ ndị na-etoeto na iburu ya ntụ buga mba Saụt Koria.

“Nnyocha gosiri na ọtụtụ ụmụ Naijiria e jidere na mba ndị ọzọ maka ibu ntụ si n’aka ya.”

“Anyị chọpụtakwara na ọ na-asa ego o letara na n’ọgwụ ike site na iji ya azụ ngwa ‘electronics’ na ahịa ndị ọzọ.

”Mba Saụt Koria na-achọ Ogbonna maka ebubo mpụ ịtụbata ntụ na mba ahụ ugboro ugboro n’agbata afọ 2023 na afọ 2024.

Dịka NDLEA sị kwuo, nwaamadi ahụ na-esi ebe zoro ezo apịkọ ndị na-eburu ya ntụ site na mba Kamerun, Gana, Bọkina Faso, Liberia nakwa mba ndị ọzọ dị n’Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *