Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere EFCC jiri wakpoo ‘Bureau d’Change’ dị n’Enugwu nakwa ebe ndị ọzọ

0 146

Ndị ụlọọrụ EFCC bụ ‘Economic and Financial Crime Commission’ na CBN bụ ‘Central Bank of Nigeria’ wakporo ọdụ mgbanwe ego dọla na ego ndị ọzọ dị n’Owerri Rd Asata Enugwu taa.

Ha bịakwasara ha na mberede nke butere ‘oke na ngwere n’ọsọ’ na gburugburu ahịa ego ahụ.

Ndịagha ji ụgbọala ha mechie ụzọ si ụlọụka St ‘Brigid Catholic’ abata owerri Rd nakwa nke si ụzọ stadium na ABC abata Owerri Rd.

Dịka nchọpụta gosiri, na ọ bụ ndị ọrụ EFCC nakwa CBN bịara nyocha i chọpụta etụ e si ere dọla, pound, Euro na ego ndị ọzọ ma ijidekwa ndị n’ezogasi dọla.

Ha nọrọ ebe ahụ ihe karịrị awa anọ tupu ha akpụrụ ụfọdụ ndị ha nwuchiri pụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *