Dịka otu izuụka Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti mechichara ahịa ukwu Onicha dị na steeti ahụ, a na-atụ anya na ahịa ga-amalite zụwa ọzọ.
Nke a mere onye ntaakụkọ jiri gaa n’ogbe ahịa ahụ na gburu gburu ya iji chọpụta “etu eke si anya anwụ”.
N’ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị, 2026 mgbe onye ntaakụkọ BBC ruru n’ahịa, ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị na-ere ihe n’ahịa ahụ bịara ahịa.
Ụfọdụ n’ime ha ji nwaayọ na-emepesi ụlọahịa ha ebe ndị ọzọ kwụụ n’ihu ụlọahịa ha na-enyere oge tupu ha emepe.
Ọ chọpụtakwara na e nwere ụfọdụ ebe ndị ka gbara chakoo n’ahịa ahụ dịka ọtụtụ ụlọahịa ka mechiri emechi.
Cheta na Gọvanọ Soludo nyere iwu ka e mechie ahịa ahụ ruo otu izuụka maka nnupuisi ha mere n’iwu o nyere sị ka a kwụsị ịnọ n’ụlọ n’ụbọchị Mọnde ọbụla.
Mana mgbe ọ gara mkpaghara n’ahịa dị iche iche na steeti ahụ n’ụbọchị 26 Jenụwarị 2026, ọ chọpụtara ndị ahịa emepeghi n’ụbọchị ahụ, nke mere o jiri mechie ya.
Ụfọdụ ndị na-ere ahịa gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ha emepeela ahịa kama na o nwebeghi ndị bịara zụọ ha ahịa.
Leave a Reply