Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii egbuola ndị ekperima atọ na Benue, nwụchie ọtụtụ ndị ntọ na Delta steeti

0 141

Ndị uweojii egbuola ndị ekperima atọ na Benue steeti mgbe ha na-eme nzukọ nzuzo ịwakpo ndị uweojii nọ na mpaghara Shitele na Ukum nke steeti ahụ.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii Naịjirịa bụ Muyiwa Adejobi kwuru na ndị ojiegbe ahụ na ndị uweojii kwara onwe ha mgbọ, dịka ndị ekperima atọ merụrụ ahụ ma nwụọ oge a na-ebuga ha ụlọọgwụ.

Ha nwetara ngwaagha dị iche iche dịka egbe ntụ abụọ na ụfọdụ mgbọ egbe.

N’ọzọ yiri ya, ndị uweojii nọ na Delta steeti nwụchiri ndị ntọ itoolu ma napụta mmadụ abụọ ndị ha ji kemgbe abali iri abuo na isii nke onwa Epril, 2025.

Ndị uweojii napụtakwara ha ọtụtụ ngwaọgụ dị iche iche ha ji arụ ọrụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *