Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ọchịchị Yurop na-ezukọ na London maka agha na nsogbu nchekwa nke Yukren

0 262

Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer amalitela ịnabata ndị ọchịchị mba dị na Yurop, bụ ndị na-ezukọ na London, isi obodo UK maka inwe mkparịtaụka banyere nkwụsị agha na nsogbu nchekwa dị na Yukren.

Ndị a na-atụ anya isonye na nzukọ a gụnyere Praịm Mịnịsta Ịtali bụ Giorgia Meloni, Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanel Macron, Chanselọ mba Jamini bụ Olaf Scholz na Praịm Mịnịsta mba Kanada bụ Justin Trudeau.

Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-esonyekwa na nzukọ ahụ ebe a na-atụ anya na ndị ọchịchị si mba dị iche iche dịka Denmark, Netherlands, Norway, Poland, Spain, FInland, Sweden, Czechia, Romania na Tọọkị, ga-abịakwa nzukọ ahụ.

Ndị ọzọ bụ Onyeisi Nato bụ Mark Rutte, Onyeisi nke European Commission bụ Ursula Von der Leyen ya na Onyeisi Kansụl bụ Antonio Costa.

Praịm Mịnịsta Starmer gwara ndi ntaakuko na UK na Fransị ga-akwado Yukren ịhụ na-akwụsịrị ọgụ. O kwuru na ha ga-ewepụta atụmatụ nke ha na mba Amerịka ga-eji enwe mkparịtaụka mgbe ọ dị n’ihu.

Nke a na-abịa mgbe ọ gachara mkpụrụ abalị ole na ole Onyeisiala Zelensky na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwechara nghọtahie na Obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House.

Praịm Mịnịsta Starmer kwuru na nghọtahie a dị n’etiti ndị ọchịchị abụọ wutere ya nke nnukwu mere ka ọ kpọọ oku ndị ọchịchị Yurop.

O kwuru na ihe atọ ya kwenyere ga-eweta udo ga-adịgịde na Yukren gụnyere – inwe Yukren siri ike ịlu ọgụ gawa ma ọ dị mkpa na ị nọ n’ọnọdụ siri ike enwe mkparịtaụka; nke abụọ bụ ịhe ndị Yurop ga-eme banyere ihebe nchekwa ya na nkwado mba Amerịka.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *