Take a fresh look at your lifestyle.

A hụla ụgbọelu Alaska ahụ na-efu efu na ozu mmadụ atọ – Ndị nchekwa US Coast Guard

0 213

Ndị nchekwa US Coast Guard ekwuola na ha ahụla ebe obere ụgbọelu Alaska ahụ na-efu efu kpọkara ya na ozu mmadụ atọ nwurụ anwụ n’ụbọchị Tọzde.

Ha kwuru na e kwenyere na ozu mmadụ asaa ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọelu ahụ, mana ha enweghị ike ịbanye n’ime ya n’ihi ọnọdụ ụgbọelu ahụ.

Dịka ndị ọchịchị siri kwuo, mmadụ iri nọ n’ime ụgbọelu Cessna Caravan craft, nke ụlọọrụ ụgbọelu Bering Air nwe, mgbe a malitere ịchọ ọnọdụ ya ihe dịka maịlị iri na abụọ (19km) n’ikpere mmiri n’ụbọchị Tọzde abali asaa nke onwa Febụwarị 2025.

Ndị nchekwa Coast Guard kwuru na mkpọmkpọ ebe ụgbọelu ahụ dị maịlị iri atọ na anọ (34) na ndịda-ọwụwa anyanwụ nke obodo Nome, ebe ọ si Unalakleet gawa.

Onye odeakwụkwọ ụgbọ njem na mba Amerịka bụ Sean Duffy kwuru na ụlọọrụ National Transportation Safety Board na-eme nyocha banyere ihe mere, site na nkwado nke ụlọọrụ Federal Aviation Administration.

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha tinye mkpụrụ obi mmadụ iri ahụ nwụrụ anwụ n’ihe mberede ugbọelu ahụ n’ekpere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *