Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe anyị ma maka ọnọdụ ahụike Ọchịagha Taoreed Lagbaja

0 457

Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na a na-akwado ịhọpụta onye ga-arụ ọrụ dịka onyeisi ndịagha Naịjirịa ma kpọọ oku ka ụmụafọ Naịjirịa ghara ige okwu ụgha ahụ nti

Ozi onyeisi mgbasaozi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Gusau wepụtara mere ka a mata na onyeisi ndịagha bụ Ọchịagha Taoreed Lagbaja gara ezumike nke dị na ezumike ya nke afọ 2024.

Ozi ahụ kwuru na enweghi ngalaba ụlọọrụ ndịagha n’eri mperi ma kwuo na ọrụ ha na-aga dịka iwu Naịjirịa si kwu.

Tukur Gusau kwuru na onye na-ahụ maka iwu na nhazi n’ụlọọrụ ndịagha bụ Abdulsalam Bagudu Ibrahim na-enye Ọchịagha Taoreed Lagbaja ozi ka ọrụ si aga.

N’ịga n’ihu. Tukur Gusau kwuru na Ọchịagha Taoreed Lagbaja ga-alaghachita n’ọrụ ya ngwa ngwa oge ezumike ya bịara na njedebe.

Isi ụlọọrụ ndịagha gwara ụlọọrụ mgbasaozi ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ maara ihe ekwe na-akụ n’okwu ọbụla ma mee nyocha tupu ha ewepụta ozi.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *