Onye na-eme nchọpụta maka imemina ọrịa kansa mana ahụkwa maka ọrịa kansa, Dokita Omolola Salako, adọla ndị ọkà mmụta maka ọrịa aka ná ntị banyere ihe na-adịghị mma nke nrụgide ọrụ na-adịghị enwe ezumike.Nke a gana ebute oke ike ogwugwu.
Dị ka Dokita Salako si kwuo, ọrịa ike ọgwụgwụ bụ ọnọdụ nke ike ọgwụgwụ nke mmetụtara uche, nhụsianya, na echiche nke imezu ihe kwesiri ekwesi.
Ndị mmadụ na-enwe ike ọgwụgwụ nwere ike ịkwụsị ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ ha, na-ewere ndị ọzọ dị ka ihe, na-eche na ọrụ ha enwekwaghị uru.
Ọ sịrị, “Ndị ọkà mmụta gbasara ọrịa kansa , ndị na-arụ ọrụ n’ihu na-emegidere ọrịa kansa, na-enwekarị ike ọgwụgwụ na-adịghị ala ala.
Iji merie ọrịa ike ogwugwu a, ọ dụrụ ndị ọkà mmụta banyere kansas ọdụ ka ha lekọta onwe ha nke ọma ka ha wee jiri ume ọhụrụ na ọmịiko nọgide na-arụ ọrụ ha bara uru.
Leave a Reply