Take a fresh look at your lifestyle.

Twitter ekwuola na ha ga-agba ‘Meta’ akwụkwọ n’ụlọikpe maka imepụta ‘Threads’

0 452

Ụlọọrụ ‘Twitter’ ekwuola na ha ga-agba ụlọọrụ Meta akwụkwọ n’ụlọikpe maka imepụta akụrụngwa soshal midia ọhụrụ a kpọrọ ‘Meta’.
Nke a na-abịa dịka ihe karịrị mmadụ nde 30 debanyere aha n’ọbaozi Threads n’ime ụbochị mbụ Meta ji wepụta ọbaozi ahụ.
Onye nwe Twitter bụ Elon Musk kwuru na ha anaghị atụ egwu mmadụ ịma ụlọọrụ ha aka, kama ha agaghị anabata iji ụzọ aghụghọ mee ya.
Threads na Twitter yiri onwe ha nke ukwuu dịka onye ntaakụkọ Tekịnụzụ ndi nta akuko si kwuo.
Ọkaiwu Twitter bụ Alex Spiro degaara ụlọọrụ Meta akwụkwọ ma bo ha ebubo “izuru ụfọdụ ihe nzuzo nke Twitter ma were ya mepụta ọbaozi ‘Threads'”.
Spiro kwuru na Meta were ọtụtụ ndị ruburu ọrụ na Twitter n’ọrụ, bụ ndị ma ọtụtụ ihe nzuzo gbasara Twitter, nke ha jizi were rụpụta Threads.
Mana ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Meta bụ Andy Stone kwuru na “onweghị otu onye so na ndị mepụtara Threads’ bụbu onye ọrụ Twitter – ụdị ihe ahụ adịghị.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *