Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu onyeisiala Naijiria   kelere onye ndu Senegal.

AISHA JOHNMARK DERE YA NA BEKEE.

0 482

Tinubu onyeisiala Naijiria   kelere onye ndu Senegal.

Onye isi ala Senegal na Mọnde gwara ndị Senegal, obodo a na-ewere dị ka otu n’ime gọọmentị onye kwuo uche ya kwụsiri ike na Africa, na ọ gaghị enye onwe ya dị ka onye ga-eso maka ntuli aka onye isi ala na February 25, 2024 na obodo ya.

Onye isi ala Naijiria  Bola Tinubu etoola mkpebi onye ogbo ya na Senegal, President Macky Sall, na ọ bụghị ịchọ ọkwa nke atọ mgbe ọchịchị ya gwụchara.

Enweela ngagharị iwe na Senegal n’ime izu ole na ole gara aga na-eso ntule gbasara ọchịchọ nke oge nke atọ nke Onye isi ala Sall, onye na-aga n’ihu na njedebe nke oge nke abụọ ya n’ọchịchị.

Sall ga-agwụcha oge ọrụ ya nke abụọ na 2024.

 

Onye isi ala Tinubu kwuru na site na mkpebi a, Onye isi ala Senegal, Sall etinyela mmasị obodo ya, udo, na nkwụsi ike nke mpaghara ọdịda anyanwụ Africa karịa mmasị ya.

Onye ndu Naijiria, onye toro mkpebi nke ogbo ya Senegal, kwuru na akụkọ ihe mere eme ga-adị mma n’ebe Onye isi ala Sall nọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *