Sineti enyela nkwado ngwa ngwa n’arịrịọ Onye isi ala Naijiria, Bola Tinubu rịọrọ ka ọ họpụta ndị ndụmọdụ iri abụọ pụrụ iche.
Arịrịọ nke Onyeisiala Tinubu dị n’akwụkwọ ozi nke Onye isi oche nke Sineti, Ahmad Lawan gụpụtara n’oge plenary na Tuuzdee.
Na arịrịọ ahụ, Onyeisi ahụ edepụtaghị aha ndị ndụmọdụ pụrụ iche a ga-ahọpụta. Mana Sineti nyere nkwado ngwa ngwa na arịrịọ ahụ ka agụchara akwụkwọ ozi ahụ.
Lawan kwuru na ọ bụ ihe ngwa ngwa ka Onye isi ala nwere ndị otu ya ka ha na ya na-arụkọ ọrụ.
Ọ sịrị; “N’ihi na enweghị aha maka ndị ndụmọdụ pụrụ iche, anyị ga-akwado ya site na ebe a, anyị chere na nke a bụ ihe dị ngwa ngwa.”
Arịrịọ a bịara ụbọchị ole na ole ka Onye isi ala Tinubu kwuputara nhọpụta onye isi oche nke Ụlọ Ndị Nnọchiteanya na-apụ apụ, Femi Gbajabiamila ka ọ bụrụ onyeisi ndị ọrụ ya, na onye bụbu Minista na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche, George Akume dị ka ode akwụkwọ nke Gọọmenti etiti.
Leave a Reply