Take a fresh look at your lifestyle.

INEC Jụrụ Ihe Ngosi Obi Na Steeti Iri Na Asaa Megide Onyeisiala Tinubu

Salihu Ali dere ya na bekee

0 416

Ndị otu Independent Electoral Commission INEC ajụla arịrịọ onye zọrọ ọkwa onyeisiala nke Labour Party (LP) bụ Maazị Peter Obi na pati ya ka ha wepụta ihe ngosi na steeti iri na asaa nke gọọmenti etiti megide ntuliaka onyeisiala Ahmed Tinubu.

Steeti ebe ewepụtara ma kwenye ihe ngosi a bụ Adamawa, Bayelsa, Benue, Kogi, Nasarawa, Niger, Ondo, Sokoto, Delta na Ekiti.

Ndị ọzọ bụ Imo, Kaduna, Oyo, Cross River, Edo, Akwa Ibom na Lagos.

E wepụrụ nke Ebonyi n’ala na INEC emebeghi ihe ngosi ahụ maka ndị na-arịọ arịrịọ abụọ.

Ngosipụta nke ihe ngosi ahụ gosiri na a gbara rịzọlt Ward n’okpuru ọchịchị 21 nke Adamawa, 8 na Bayelsa, 23 na Benue, 21 na Kogi, 11 na Nasarawa, 25 na Niger, 18 na Ondo, 23 na Sokoto na 25 na Delta.

Ndị ọzọ bụ Local Government Area 11 nke Ekiti State, 25 n’Imo, 21 na Kaduna, 27 na Oyo, 18 na Cross River, 15 na Edo, 31 na Akwa Ibom na 20 na Lagos.

Ihe ngosi ndị a kacha sitere na EC8B nke òtù ntuli aka ahụ ji were na-achịkọta rịzọọtụ na ọkwa Ward nke steeti n’oge ntuliaka onyeisiala n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị megidere ịbụ ndị INEC nyere Obi na Labour Party ihe ngosi ahụ.

Ndị INEC nọchitere anya na Ụlọikpe Ntuli aka nke Presidential Election PEPC site n’aka s Senior Advocate of Nigeria SAN, Steve Adehi, mgbe ọ na-emegide nkwenye nke akwụkwọ ahụ, agbanyeghị, gwara ụlọ ikpe ka ha nye nkọwa maka mkpesa ya na ọkwa adreesị nke usoro ahụ.

Ọkaiwu Obi na Senior Advocate of Nigeria SAN  Benbella Anachebe ka ọ na-ewebata akwụkwọ ahụ kọwara na e nwetara ihe ngosi ahụ n’aka INEC.

E wezụga nke ahụ, Anachebe kwuru na ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka ntuli aka kwadoro akwụkwọ ndị ahụ tupu ha ahapụ ya ndị ahịa ya.

Ewezuga INEC nke mere ntuliaka ahụ n’esemokwu, onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na ndị All Progressives Congress APC bụ ndị e kwuru na ha meriri na ntuliaka ahụ gbakwara ụkwụ megide nnabata ihe ngosi ahụ.

Otú ọ dị, n’ikwekọ na akụkọ tupu ntị na nkwekọrịta nke ndị ndụmọdụ, a ga-edobe ihe kpatara mkpesa ahụ na ọkwa adreesị nke ịnụrụ arịrịọ ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, onye isi oche nke ụlọikpe ahụ, Justice Haruna Simon Tsammani akwụsịla ikpe n’ihu n’arịrịọ ahụ ruo abalị asaa onwa Juun.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *