Take a fresh look at your lifestyle.

Ọrịa Akụrụ: Igbu Oge Na Nchọpụta Ya Bụ Nnukwu Ihe Ịma Aka – Ọkachamara

Chigo dere ya na bekee.

0 268

Onye na-ahụ maka nlekọta ahụike Benin bụ Oseyomon Okaiwele ekpughere na nnukwu ihe ịma aka nke ọrịa akụrụ bụ igbu I’ve n’ ịchọpụta ya.

Dị ka ya si kwuo, pasent 80 nke ndị nwere ọrịa akụrụ amaghị na ha nwere ya ruo mgbe ọ ruru ọkwa dị elu.

Mgbe ọ na-ekwu okwu na mmalite nke ọrụ dialysis maka akụrụ na ụlọọgwụ dị na Benin, Edo steeti, o kwuru, “Isi ihe ịma aka nke ọrịa akụrụ bụ  ogbu I’ve n’ịchọpụta ya. Ihe dị ka pasentị 80 nke ndị nwere ọrịa ahụ amaghị na ha nwere ya, na oge a chọpụtara ọrịa a nọ n’ọkwa di elu o were mara.

“N’ime nde mmadụ iri abụọ na Naịjirịa nwere nsogbu akụrụ, ụfọdụ n’ime ha ga-anọ na ọkwa nke mbụ, abụọ, atọ, anọ na ise. Mgbe mmadụ ruru ọkwa ise, nke ahụ bụ ebe a chọrọ dialysis na transplant,” ka o kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *