Take a fresh look at your lifestyle.

Cameroon na-eme emume na ha agbala afọ iri ise na otu.

Chigo dere ya n'igbo.

0 418

Cameroon na-eme emume afọ 51 dị ka mba jikọrọ ọnụ na ndị agha na ndị nkịtị. na-eme emume ụbọchị ịdị n’otu na  Yaoundé is obodo ya.

 

N’ime ihe niile ma e wezụga afọ 10 n’ime afọ ndị ahụ ọ bụ nanị otu nwoke, Onye isi ala Paul Biya chịrị ya,ọ bụzi onyeisi ala kacha ochie n’ụwa.

 

Obodo a adịchaghị  ugbu a .Ọtụtụ puku mmadụ  ka egbuola kemgbe 2016 . Ihe karịrị otu nde mmadụ  ka achụpụrụ mgbe otu ndị Anglophone Cameroon malitere ịlụso ọchịchị Francophone Biya ọgụ.

 

Ụfọdụ ndị na-ekiri ihe ngosi ahụ kwuru na ha nwere nchekwube maka ọdịnihu obodo ha ma nabata ụbọchị ahụ.

 

“Ọ bụ ichetara na anyị bụ otu ndị mmadụ, ọ bụ icheta na ọ bụ ọnụ ka anyị nwere ike iwulite na ịzụlite, ọ bụ icheta na ọ bụ ọnụ ka anyị nwere ike inwe obi ụtọ, ọ bụ ọnụ ka anyị nwere ike ibi n’udo,” ka Therese Temgoua kwuru . onye Cameroonian Francophone bụ onye isi ụlọ akụ.

 

“Echere m na ọ bụ ụbọchị obi ụtọ, ihe m hụkwara taa na-egosi na ọchịchị onye kwuo uche ya nke Cameroon nọ n’ezie,” Enobi Akepe, onye Cameroonian anglophone nke bụ onye nkụzi mahadum, kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *