Take a fresh look at your lifestyle.

UK: Ahọpụtala onye isi kọmishọna ọhụrụ maka Naijiria.

Bilkisu Halilu Pai drer ya na bekee.

0 317

UK ahọpụtala onye isi kọmishọna ọhụrụ maka Naijiria

Mba United Kingdom ahọpụtala Richard Montgomery ka ọ bụrụ onye isi ala Britain ọhụrụ na Naịjirịa.

Ọ na-eweghara n’aka Nwada Catriona Laing CB, bụ onye mechiri ọrụ afọ anọ ya na nso nso a dị ka High Commissioner na Naijiria.

Ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ ekwela nkwa na ya na ndị Naijiria gụnyere ndị nọ n’ọchịchị, ndị ọrụ nọrọ onwe na ndị obodo ga-arụkọ ọrụ, iji nyere aka wulite obodo Naijiria.Ma na-aga nke ọma  mee ka mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ sie ike.

Richard bụ onye nnọchi anya mba ụwa nke rụrụ ọrụ n’akụkụ dị iche iche nke ụwa gụnyere  na Naịjirịa.

Tupu ọ bụrụ onye isi ala Britain na Naijiria, Richard bụ onye isi nchịkwa UK na World Bank Group Board site na 2018 ruo 2022 na Washington DC, nke mba USA.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *