Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Steeti Lagos na-eme ihe iji gbochie ide mmiri.

KAMILA BELLO DERE YA NA BEKEE.

0 333

Gọọmenti Steeti Lagos na-eme ihe iji gbochie ide mmiri.

Gọọmenti Legọs steeti, kwuru na o meela ihe iji gbochie ide mmiri sitere na oke mmiri ozuzo na steeti ahụ.

Onye odeakwụkwọ  maka gburugburu Maazi Olalekan Shodeinde, kwuru nke a n’oge ‘Downscaling Workshop on the Seasonal Climate Predictions and Socio-Economic Implications nke Steeti ahụ,’ nke e mere na Lagos.

O kwuru okwu site n’ọnụ Director, Drainage Enforcement and Compliance, Mr Mahmood Adegbite, kwuru na, NiMet, na Ministry weputara kwa afọ Seasonal Climate Predictions, SCP, na mbido afọ iji mee ka ọha na eze mara banyere mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba. mmetụta nke oge mmiri ozuzo.

“N’oge a, anyị chọrọ ime ka obi sie gị ike na steeti anyị ga-aga n’ihu na-agbali usoro iji gbochie ide mmiri mmiri ozuzo ọ bụla.”

Ọ gbara ndị bi na ya ume ka ha nọgide na-akwado mbọ gọọmentị na-agba site na ikpochapụ ọwa mmiri mgbe niile n’ihu ha iji hụ na mmiri ozuzo na-asọpụta n’efu yana kwụsị ịkwanye ihe mkpofu n’ime ọwa mmiri.

N’okwu ya, onye isi ụlọ ọrụ NIMET, Mr Oyegade Adeleke, kwuru na a na-atụ anya oke mmiri ozuzo site na May ruo June na ihe gbasara nke 50mm n’otu ụbọchị na pasent 80 na Badagry, Lagos Island, Lagos Mainland, Epe, Eti-Osa, Ibeju/Lekki and Ikeja.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *