Take a fresh look at your lifestyle.

Steeti Ebonyi: Emume Izuụka Ndị Ọrụ Ahụike Mba Ụwa Nke Afọ 2023.

Moses Nwite sweet ya na bekee.

0 288

 

Steeti Ebonyi :Emume Izuụka Ndị Ọrụ Ahụike Mba Ụwa Nke Afọ 2023.

 

Gọọmenti steeti Ebonyi na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa esonyela ndị ogbo ya n’ụwa iji mee emume izuụka ndị ọrụ ahụike mba ụwa nke afọ 2023 site n’aka Ministri na-ahụ maka ahụike na steeti ha.

 

Ihe omume a na-eme kwa afọ na-enye ohere ime emume ndị ọrụ chụrụ  àjà n’ịkwalite ngalaba ahụike na Naịjirịa.

 

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike  na steeti ahụ, Dọkịnta Daniel Umezurike, onye nọchitere anya ya bụ onye isi ngalaba na-ahụ maka nyocha atụmatụ na ọnụ ọgụgụ, Oriakụ Adanna Ugwoke kwupụtara nke a mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n’oge mmemme ahụ n’ama egwuregwu Pa Ngele Oruta Township dị n’Abakaliki isi obodo steeti ahụ.

 

Emume a bụ njem siri n’ụlọ gọọmenti ochie, site n’ụzọ ochie Enugwu ruo Abakaliki laghachi n’ama egwuregwu.

 

Ndị ọrụ ngalaba ahụike niile na ndị na-ahụ maka ọrụ sonyere na oke ije n’okporo ụzọ .

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *