Take a fresh look at your lifestyle.

Etu Prince Harry si laa n’egbughị oge n’emume ichieze nna ya

0 332

Prince Harry gara emume ichieze nnaya naanị ya, nwunye ya bụ Meghan Markle esoghi ya gaa

Prince Harry, nwa nwoke nke abụọ nke Eze Charles III, bịara emume ichieze nna ya n’ụbọchị Satọdee, ma laghachikwa mba Amerịka n’otu ụbọchị ahụ na-egbughị oge.

Harry, onye jikwa ọkwa Duke nke Sussex, bịara emume ahụ naanị ya, nwunye ya bụ Meghan Markle esoghị ya bịa dịka o kwuburu na ya agaghị aga ya bụ emume. Ọzọkwa bụ na ụbọchị emume ichieze a bụkwa ụbọchị nwa ha bụ Archie mere ncheta ọmụmụ ya nke afọ anọ.

N’emume ahụ, Prince Harry nọdụrụ n’azụ na mpaghara ebe ndị ezinụlọ eze nọ

Ebe e nyere Harry oche n’oge emume ahụ bụ n’ahịrị nke atọ, mana nwanne ya nwoke bụ nọ n’ahịrị nke mbụ.

N’oge emume olili Ezenwaanyị Elizabeth II, Harry nọ n’ahịrị nke abụọ, n’azụ nna ya bụ Eze Charles.

Dịka e mechara emume ofufe n’ụlọụka Westminster Abbey ebe a nọ kpube Eze Charles okpueze, ezinụlọ eze laghachiri n’obi Buckingham Palace, ebe ha nọrọ kelee puku kwuru puku ndị mmadụ bịara ya bụ mmemme.

O doburu anya na Prince Harry ga-abịa emume ahụ naanị ya, nakwa onweghị ọrụ ọbụla a ga-enye ya n’ihi na ọ bụzighị onye nwere ọkwa ọbụla n’ezinụlọ obieze.

Otu a kwa ka ọ dị maka Prince Andrew – nwanne nwoke Eze Charles III – onye gbara arụkwaghịm n’ọkwa ya dịka onye ezinụlọ obieze n’afọ 2020 n’ihi ebubo ịtụ mgbere na imetọ nwaanyị.

 

Ngwangwa emume ofufe n’ụlọụka Wstminster Abbey gbasara, Harry banyere n’ụgbọala naanị ya, dịka akụkọ kwuru na ọ gawara ọdụ ụgbọelu ebe ọ bara ụgbọelu British Airways laghachi Amerịka.

Harry batara na UK na mgbede ụbọchị Fraịde, mana n’ebe mgbede Satọde, ọ tụọla ụkwụ na Los Angeles mba Amerịka, dịka akụkọ kwuru na ọ chọrọ isonye n’emume ncheta ọmụmụ nwa ya nwoke, Archie.

Mmekọrịta Prince Harry na ndị ezinụlọ obieze ndị ọzọ adịchaghị mma kamgbe o wepụtara akwụkwọ ya ebe ọ kọwara ọtụtụ ihe mere ya n’obi eze.

Akwụkwọ ahụ kọwara nnọọ nke ọma nghọtahie dị icheiche Harry na ụfọdụ ndị ezinụlọ ya nwere, tinyere mgbe nwanne ya bụ William chọrọ ịlụso ya ọgụ.

‘ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020 ka Prince Harry na Meghan Markle kwuru na ha ga-ewepu onwe ha n’ịrụ ọrụ dịka ndị ezinụlọ obieze nke mba England.

Ka ọ dị ugbua, ha abụọ bipụrụ iche na California nke mba Amerịka, ha anaghịzi arụ ọrụ ọbụla dịka ndị ezinụlọ obieze, ha anaghịkwa anata ego ọbụla n’aka obieze.

Na mkparịtaụka ya na onyentaakụkọ Oprah Winfrey nwere n’ọnwa Maachị 2021, Harry kwuru na ọ bụ ego o nwetara n’aka nne ya bụ Princess Diana nwụrụ anwụ, nyeere ya aka oge ya na nwunye ya si n’obieze pụọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *