Take a fresh look at your lifestyle.

 Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịgbasa ọdụ ụgbọ elu Steeti Katsina .

Aisha John-Mark dere ya bekee.

0 442

Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịgbasa ọdụ ụgbọ elu Steeti Katsina .

Ọdụ Ụgbọ elu Shehu Musa Yar’adua dị na Steeti  Katsina , n’ugwu ndida anyanwu Naijiria  bu nke a chọrọ ka abawanye, amalitela iji kwalite mmepe akụ na ụba na nchekwa na steeti ahụ.

Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọ elu bụ Sinetọ Hadi Sirika kwuru nke a n’oge emume mwube ọrụ a na steeti ahụ.

Sinetọ Sirika kwuru na ọ dị mkpa ịgbasa ọdụ ụgbọ elu Umaru Musa Yar’adua dị ka ihe ncheta ndị obodo steeti ahụ na Naijiria.

O kwuru na mgbasawanye ahụ bụ ihe ndị ọzọ ga-enyere ndị ọrụ nchekwa aka ịrụ ọrụ ha na mpaghara ugwu Naijiria.

Onye ozi ahụ kpughere na 70% nke ngụkọta ego ekenyela maka ọrụ a akwụgolarị ndị ọrụ yana akụrụngwa maka ndozigharị ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *