Inec akpọpụtala aha Chidi Nwoke Victor nke otu Peoples Democratic Party (PDP) dịka onye ga-anọchite mpaghara Ebonyi North n’ụlọomeiwu.
Nke a so na mpụtara ngụkọ ntuliaka mgbakwunye e mere n’akụkụ ụfọdụ n’Ebonyi steeti n’ụbọchị Satọdee, abalị 15 nke ọnwa Eprel, 2023.
Lee ka ngụkọ si ebe ahụ siri dị dịka Inec siri kpọpụta ha:
– PDP (Nwoke Victor Chidi) – Vootu 5,988
– APC (Umahi Maxwell) – Vootu 5,664
– AA – 19
– ADC – 26
– ADP – 30
– APGA – 4,221
– APM – 10
– LP – 2,465
– NNPP – 51
– NRM – 10
– ZLP – 14
Ọkammụta Smart Otu bụ onye nọ n’isi ọrụ ngụkọ Inec bụ onye mere mkpọpụta a.
Ka akpọpụtara ha Maazị Nwoke, ọ gwara BBC Igbo:
“Obi jụpụtara m n’aṅụrị, ana m eleke ndị nkwadoro ma tụnyere vootu. A na-arịọ ndị ọha mmadụ ka ha nọrọkwa m n’azụ mgbe malịtere ọrụ.”
Ọ gara n’ihu kwee nkwa na ọ ga-ahụ na o mepụtara iwu ndị ga-adịrị mpaghara Ebonyi North bụrụ ebe mepere emepee.
Ọtụtụ ndị nkwado pati ahụ nakwa ndị nkwado Nwoke pụtara na-agụ egwu ọṅụ ma na-agba egwu n’ogige ebe e mere mkpọpụta a.
Inec kwuru na e mere ntuliaka mgbakwunye a n’ihi mkpamkpa dị iche iche nke mere ka a kagbuo ntụliaka a nke emeburu n’ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
N’Ebonyi Steeti, mpaghara a ebe ndị e mere ntuliaka a metụtara okpuruọchịchị asaa nọ n’Ebonyi steeti nke gụnyere Abakaliki, Afikpo North, Afikpo South, Ezza North, Ezza South, Ikwo na Ivo.
Leave a Reply