Take a fresh look at your lifestyle.

A tọrọla ihe ruru ụmụakwụkwọ iri na Kadụna steeti

0 366

Akụkọ ọhụrụ apụtala nke gbara ama na ndị omekome atọrọla opekatampe, ụmụakwụkwọ iri n’otu ụlọakwụkwọ gọọmentị dị n’akụkụ obodo Awon nke Kaduna steeti n’ụbọchị Mọnde.

Kaduna steeti so na steeti ebe ndị omekome na-apaghari egbe ma na-awakpo ndị mmadụ n’akụkụ mpaghara ugwu Naịjirịa.

N’afọ 2021, a tọrọrọ narị kwuru narị ụmụakwụkwọ n’akụkụ ebe ahụ dị a nara ndị ezinaụlọ ha ego mgbapụta.

Na nso nso a, akụkụ mwakpo na ntọrọ ndị a belataturu.

Cheta na otu n’ime ihe gọọmentị Naijirịa kwuru mere e jiri gbanwee akwụkwọ ego Naịra bụ iji hụ na ya bụ atụmatụ busoro ndị ntọ na-ana ego agha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *